Abụ Ọma 130

N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova.
2 Onye-nwem, ge nti olum: Ka nti-Gi nāṅa kwa N'olu nke aririọ-amaram nile.
3 Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja, Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?
4 Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di, Ka ewe tua egwu Gi.
5 Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya, Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo.
6 Nkpuru-obim nēchere Jehova, Karia ka ndi-nche si echere ututu; E, karia ka ndi-nche si echere ututu.
7 Israel, chere Jehova: N'ihi na n'aka Jehova ka ebere di, Nb͕aputa riri nne di kwa n'aka-Ya.
8 Ya onwe-ya gāb͕aputa kwa Israel N'ajọ omume-ya nile.