Abụ Ọma 77

Olum ka m'nēji etiku Chineke, m'gēti kwa nkpu; Olum ka m'nēji etiku Chineke, Ọ gāṅakwam nti.
2 N'ubọchi nkpab͕um Onye-nwe-ayi ka m'chọrọ: Akam setiri eseti n'abali, o sinwukwaghi; Nkpuru-obim juru ka akasie ya.
3 M'gēcheta Chineke, su kwa ude nke-uku: M'gātughari uchem, ọzọ, mọm adighi-enwe ike. Selah
4 I jidere ndi-nche nke anyam abua: Ọ b͕aram ghari, m'we ghara ikwu okwu.
5 Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie, Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,
6 M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali: M'gēso obim tughari uche; Mọm we chọsie ike, si,
7 Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju? Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?
8 Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo? Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?
9 Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke? Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah
10 M'we si, Ọriam ka nka bu; Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.
11 M'gēhota omume nile nke Ja; N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.
12 M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile, Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.
13 Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di: Ònye bu chi uku dika Chineke?
14 Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu: I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.
15 I jiwo ogwe-aka-gi b͕aputa ndi-Gi, Bú umu Jekob na Josef. Selah
16 Miri huru Gi, Chineke; Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u: Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.
17 Igwe-oji nile wupuru miri; Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà: Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.
18 Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu; Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.
19 N'oké osimiri ka uzọ-Gi di, Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri, Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.
20 I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.