Abụ Ọma 120

Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim, O we zam.
2 Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha, Na n'ire aghughọ.
3 Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi, Gi ire aghughọ?
4 Àkú di nkọ nke dike, Ha na icheku-ọku nke osisi broom.
5 Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek, Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!
6 Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworo N'akuku onye nākpọ udo asì.
7 Mu onwem bu onye-udo: Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.