Abụ Ọma 142

Olum ka m'ji etiku Jehova; Olum ka m'ji ariọ Jehova aririọ-amara.
2 Anamekwuwa okwu ntamum n'iru Ya; Ahuhum ka m'nēgosi n'iru Ya.
3 Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.
4 Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim
5 Etikurum I, Jehova; Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm, Na òkèm n'ala ndi di ndu.
6 Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli: Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim.
7 Me ka nkpuru-obim si n'ebe emechibidoworo ya puta, ka m'we kele aha-Gi: Mu ka ndi ezi omume gāb͕a buruburu; N'ihi na I nēmesom nke-ọma.