Abụ Ọma 62

Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du: N'aka-Ya ka nzọputam si bia.
2 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne.
3 Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu? Unu nētipia ya, unu nile, Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.
4 Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù; Okwu-ugha nātọ ha utọ: Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah
5 Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim; N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.
6 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.
7 N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di: Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.
8 Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya; Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri: Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah
9 Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.
10 Unu atukwasila obi na nmeb͕u, Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.
11 Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu, Ub͕ò abua ka m'nuworo nka; Na ike nile bu ihe Chineke nwere:
12 Ọ bu kwa Gi nwe ebere, Onye-nwe-ayi: N'ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula dika ọlu-ya si di.