Abụ Ọma 47

Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.
2 N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu; Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.
3 Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi, Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.
4 Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi, Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah
5 Chineke ewerewo iti-nkpu rigo, Jehova ewerewo olu opì-ike rigo.
6 Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma: Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma.
7 N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu: Bùkuenu Ya abù ọma, maschil.
8 Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya.
9 Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha Ibu ndi Chineke nke Abraham: N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa; Emewo ka Ọ di elu nke-uku.