Abụ Ọma 1

Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.
2 Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.
3 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.
4 Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.
5 N'ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n'ikpé, Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume.
6 N'ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume: Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.