Isi 6

Job we za, si,
2 Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma, Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!
3 N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile: N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.
4 N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.
5 Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu? Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?
6 Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya? Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?
7 Ihe nkpuru-obim nāju imetu, Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.
8 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!
9 Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.
10 Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.
11 Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?
12 Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu? Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?
13 Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem? Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?
14 Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.
15 Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;
16 Nke nēji nji n'ihi ice, Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:
17 Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu: Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.
18 Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha; Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.
19 Ndi-ije nke Tima legidere anya, Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.
20 Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.
21 N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe; Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.
22 Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe? Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?
23 Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u? Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?
24 Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.
25 Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè! Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?
26 Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.
27 Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.
28 Ma ub͕u a kwenu ichem iru; Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?
29 Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi; E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.
30 Ọ̀ di ajọ omume di n'irem? Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?