Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 17

Emebiwo mọm, emewo ka ubọchim gwusia, Ílì dirim.
2 N'ezie ikwa-emò diyerem, Anyam nānọ kwa ọnọdu-abali n'ikpasu-obi-ilu nile ha.
3 Biko, do ihe-ibe, burum onye-mbe n'ebe Gi onwe-gi nọ; Ònye ka ọ bu, bú onye gānaram n'aka?
4 N'ihi na I zopuwo obi-ha n'inwe ezi uche: N'ihi ya I gaghi-ebuli ha elu.
5 Onye nēgosi ndi-eyì-ya inara òkè, Ọbuná anya umu-ya gādala n'isi.
6 Ọzọ, O guzowom dika ilu nke ndi nile di iche iche; Onye ha nābusa ọnu-miri n'iru-ya ka m'ghọwo-kwa-ra.
7 Anyam we nāhu inyoghi-inyoghi site na nkpasu-iwe, Ihe dim n'aru di ka onyinyo, ha nile.
8 Ibobo bayere nka gānwu ndi ziri ezi n'aru, Onye nēmeghi ihe ọjọ gākpọte kwa onwe-ya imegide onye emeruru emeru.
9 Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.
10 Ma otú ọ di, biko, unu nile chigharia, bia: Ma m'gaghi-achọta onye mara ihe n'etiti unu.
11 Ubọchim nile agabigawo, emebiwo nzubem nile, Bú ihe-nnweta nke obim.
12 Ha nēdo abali n'ọnọdu ehihie: Ha nāsi, Ìhè di nso iru ọchichiri.
13 Ọ buru na elem anya ala-mọ na ọ gābu ụlọm; Ọ buru na ab͕asawom utem n'ọchichiri;
14 Ọ buru na akpọwom olùlù òkù, si, Nnam ka i bu; Kpọ kwa ikpuru òkù, si, Nnem na nwa-nnem nwayi ka i bu;
15 Òle ebe kwa ka olile-anyam di ub͕u a? Olile-anyam kwa, ònye gēkiri ya?
16 Rue ihe di n'ala-mọ ka ha gārida, Ọ buru na izu-ike adirim otù mbe ahu n'ájá.