Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 24

Gini mere Onye puru ime ihe nile nējighi tukọba mb͕e? Gini mere ndi mara Ya nējighi hu ubọchi-Ya nile?
2 Ufọdu nēwezuga ókè-ala; Ha anapuwo kwa ìgwè aturu n'ike, we nāzù ha.
3 Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.
4 Ha nēsi n'uzọ wezuga ndi-ob͕eye: Ndi ewedara n'ala nke uwa ezobekowo onwe-ha n'otù.
5 Le, dika inyinya-ibu-ọhia n'ọzara Ka ha nāpu ije ọlu-ha, nāchọsi nri-ọtita-ha ike; Ala ihe nādighi nēmere ha nri umu-ha gēri.
6 N'ọhia ka ha nile n'otù n'otù nwe nri-ha agwara agwa dika ihe-ubi; Ha nātutukọ kwa nkpuru-vine fọduru n'ubi-vine onye nēmebi iwu.
7 Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.
8 Oké miri-ozuzo nke ugwu nēde ha, Ma ebe ha nēnweghi ebe-nb͕abà, ha we b͕akua oké nkume.
9 Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:
10 Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;
11 N'etiti mb͕idi-ha ka ha nāpi manu; Ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile ha ka ha nāzọ ukwu, ma akpiri nākpọ ha nku.
12 Ha nēsi n'obodo ndikom sua udè, Nkpuru-obi ndi emeruworo aru nētiku Chineke: Ma Chineke adighi-agu ya n'ihe-nzuzu.
13 Ndi ahu nọ n'etiti ndi nānupu isi n'okpuru ìhè; Ha amataghi uzọ-ya nile, Ha ebighi kwa n'okporo-uzọ-ya nile.
14 Ìhè ututu ka ob͕u-madu ji bilie, o nēb͕u onye ewedara n'ala na ob͕eye; N'abali kwa ọ di ka onye-ori.
15 Ọzọ, anya onye nākwa iko nāriba chi-ojiji ama, Si, Ọ dighi anya ọ bula gēkirim: Ọ nēzobe iru-ya.
16 O gwupúwo ulo n'ọchichiri: N'ehihie ha nēmechibido onwe-ha uzọ; Ha amaghi ìhè.
17 N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu; N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.
18 Onye di nfe n'elu miri ka ọ bu; Anākọcha òkè-ha n'uwa: Ọ dighi-eche uzọ ubi-vine iru.
19 Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike: Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.
20 Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.
21 Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa; Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.
22 Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya: O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.
23 Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya; Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.
24 Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi; Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile, Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.
25 Ma ọ buru na ọ dighi otú a ub͕u a, ònye gēme ka amara na abum onye-ugha, Me okwum ka ọ buru ihe-efu?