Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 26

Job we za, si,
2 Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike? Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?
3 Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe? Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?
4 Ònye ka i gosiworo okwu? Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?
5 Ndi nādighi ndu nāma jijiji N'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.
6 Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.
7 Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu, O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.
8 Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya; Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.
9 Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike, Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.
10 Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri, Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.
11 Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji, Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.
12 Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du, Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.
13 Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma; Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.
14 Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile: Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya! Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?