Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 25

Bildad, bú onye Shua we za, si,
2 Ọchichi na oké egwu di n'aka-Ya; O nēme udo n'ebe-Ya nile di elu.
3 Usu-Ya, hà nwere ọnu-ọgugu? Ònye kwa ka ìhè-Ya nādighi-awakwasi?
4 Màdu gēsi kwa aṅa buru onye ezi omume n'iru Chineke? Ma-ọbu, ò gēsi aṅa di ọcha n'obi, bú onye nwayi muru?
5 Le, ọbuná ọnwa adighi-eti, Ọzọ, kpakpando adighi ọcha n'anya-Ya:
6 Ò gēsi kwa aṅa di ọcha, bú madu, nke bu nání ikpuru? Ma-ọbu nwa nke madu, nke bu nání idide?