Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 40

Jehova we za Job, si,
2 Onye nādọ aka na nti, ọ̀ nāluso Onye puru ime ihe nile ọ̀gù? Onye nābara Chineke nba, ya za ya.
3 Job we za Jehova, si,
4 Le, abum onye elelìworo; gini ka m'gāzaghachi Gi? Atukwasiwom, akam, n'ọnum.
5 Otù ub͕ò ka m'kwuworo okwu, m'gaghi-aza kwa; E, ub͕ò abua, ma m'gaghi-aza kwa ọzọ.
6 Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,
7 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike: M'gāju gi, gi me kwa ka M'mara.
8 Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?
9 Ma-ọbu ọ̀ bu ogwe-aka dika Chineke ka i nwere? Ọ̀ bu kwa olu dika Ya ka i gēji ma dika éb͕è-elu-igwe?
10 Biko, were nbili-elu na idi-elu chọ onwe-gi nma; Were kwa ebube na ima-nma yikwasi onwe-gi.
11 Wusa nrubiga-ókè nke iwe-gi: Hu kwa onye-npako ọ bula, me ka ọ di ala.
12 Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.
13 Zobekọ ha n'ájá; Kechie iru-ha n'ebe zoro ezo.
14 Emesia Mu onwem gēkele kwa gi, Si na aka-nri-gi nāzọputa gi.
15 Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi.
16 Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya.
17 Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya.
18 Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè.
19 Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso.
20 N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú.
21 N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti.
22 Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu.
23 Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.
24 Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?