Isi 4

Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2 Asi na otù onye anwa igwa gi okwu, ìke gāgwu gi? Ma ònye puru ib͕ọchi onwe-ya n'ikwa okwu?
3 Le, i dọwo ọtutu madu, aka na nti, I nēme kwa ka aka nke nādighi ike di ike.
4 Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike, I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.
5 Ma ub͕u a ọ nābiakute gi, ike we gwu gi; Ọ nēmetu gi aru, i we ma jijiji.
6 Ọ̀ bughi egwu-Chineke-gi bu ntukwasi-obi-gi? Ọ̀ bughi kwa izu-okè uzọ-gi nile bu olile-anya-gi?
7 Biko, cheta, ònye laworo n'iyì, mb͕e ya onwe-ya bu onye nēmeghi ihe ọjọ? Ma-ọbu òle ebe ezipuwo ndi ziri ezi?
8 Dika m'huworo anya, ndi nēgwu ajọ ihe dika ala-ubi, Ndi nāgha kwa nmeb͕u dika nkpuru-ọghigha, ha nēwe ya dika ihe-ubi.
9 Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì, Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.
10 Ọb͕ub͕ọ-uja ọdum, na olu ọdum nāb͕ọ uja, Na ezé umu-ọdum, ka emebiworo.
11 Oke-ọdum nāla n'iyì site n'enweghi ihe ọ dọb͕utara, Umu nke nne-ọdum ekesawo kwa onwe-ha.
12 Ma mu ka ezutara okwu n'ori nye, Ntim we nara ntakwu nke sitere na ya.
13 N'èchìchè sitere n'ọhù nile nke abali, Mb͕e oké ura nādakwasi madu,
14 Oké egwu zuterem, ya na ima-jijiji, O we me ka ọtutu ọkpukpum tua oké egwu.
15 Otù mọ we gabiga n'irum; Aji anu-arum we guzo ọtọ.
16 Ọ nēguzo eguzo, ma amataghm otú ọ di n'ile ya anya; Otù udi di n'iru anyam: Idebe-ọnu-du di, ma olu ka m'nānu, si,
17 Madu, ọ̀ gābu onye ezi omume kari Chineke? Nwòke gādi ọcha kari Onye kèworo ya?
18 Le, ọbuná ndi-orù-Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi; Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ nēbo ebubo na ha bu ndi-nmehie:
19 Ò gesi kwa aṅa ghara ibo kari ndi bi n'ulo urọ? Nke ntọ-ala-ha di n'ájá, Ndi anāzọpia azọpia dika nla.
20 Site n'ututu rue anyasi anētib͕u ha: Ha nāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi, ma ọ dighi onye nātukwasi ya obi.
21 Àdopughi udọ̀ ulo-ikwū-ha nime ha? Ha nānwu, ọ bughi kwa n'amam-ihe.