Job
Isi 13
Le, ihe a nile ka anyam huworo,
Ntim anuwo, ghọta kwa ya.
2 Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem:
Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.
3 Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,
Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
4 Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,
Ndi-dibia efu ka unu nile bu.
5 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!
Ọ we ghọro unu amam-ihe.
6 Biko, nurunu iru-ukam,
Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.
7 Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?
Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?
8 Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?
Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
9 Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?
Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?
10 Ọ ghaghi ibara unu nba,
Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.
11 Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?
Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?
12 Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,
Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.
13 B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem,
Gini gāgabiga kwa n'arum?
14 N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém,
Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?
15 Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere:
Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.
16 Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;
N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.
17 Nurunu okwum nile nke-ọma,
Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.
18 Biko, le, edowom ikpém n'usoro;
Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.
19 Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?
N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.
20 Nání emelam ihe abua,
Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:
21 Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;
Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
22 Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;
Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
23 Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?
Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
24 N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,
Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?
25 Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?
Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?
26 N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem,
I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:
27 I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;
I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:
28 Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká,
Dika uwe nke nla riworo.