Job
Isi 18
Bildad, bú onye Shua, we za, si,
2 Rùe ole mb͕e unu ganēsiri okwu ọnyà?
Ghọtanu, ma emesia ayi gēkwu.
3 Gini mere aguworo ayi ka anumanu?
Ayi aghọwo ndi ruru árú n'anya-unu.
4 Ọ nādọka onwe-ya n'iwe-ya.
Àgārapu uwa n'ihi gi?
Ma-ọbu àgākwapu oké nkume n'ọnọdu-ya?
5 Ọzọ, agēmenyu ìhè nke ndi nēmebi iwu,
Ọ dighi kwa ire-ọku nke ọku-ya gēnwu.
6 Ìhè aghọwo ọchichiri n'ulo-ikwū-ya,
Agēmenyu kwa oriọna-ya n'elu ya.
7 Agākpagide nzọ-ukwu nile nke ume-ya,
Ndum-ọdu-ya gātuda kwa ya.
8 N'ihi na eji ukwu-ya abua ziga ya n'ub͕u eji eb͕u anu,
Ọ nējeghari kwa n'elu ihe-ntuhi.
9 Ib͕udu gādakwasi ya n'ikiri-ukwu,
Ọnyà gāma ya.
10 Ezobeworo ya udọ̀ n'ala,
Na ihe iji nwude ya n'elu uzọ.
11 Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu,
Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.
12 Agu ganāgu ume-ya,
Edoziwo kwa nhuju-anya n'akuku-ya.
13 Ọ gēripia ihe di n'akpukpọ-aru-ya,
Ọkpara ọnwu gēripia ihe nile di ya n'aru.
14 Agādọpusi ya ike n'ulo-ikwū-ya, bú ihe-ntukwasi-obi-ya;
Agēme ka ọ zọrọ ukwu gakuru eze nke ihe-egwu nile.
15 Ihe nābughi nke ya gēbi n'ulo-ikwū-ya:
Agēfesa brimstone n'elu ebe-obibi-ya.
16 Nkpọrọgwu-ya gākpọ nku n'okpuru,
Agēbipu kwa alaka-ya n'elu.
17 Ncheta-ya alawo n'iyì pua n'uwa,
Ọ dighi kwa aha ọ gēnwe n'èzí.
18 Agākwapu ya n'ihè ba n'ọchichiri,
Agēme kwa ka o si n'elu-uwa dum madu bi waghari.
19 Ọ dighi umu, ọ dighi kwa umu umu, ọ gēnwe n'etiti ndi-ya,
Ọ dighi kwa onye fọduru n'ọnọdu-ọbìa-ya nile.
20 Ibobo bayere ubọchi-ya anwuwo ndi bi n'akuku Ọdida-anyanwu n'aru,
Ndi bi n'akuku Iru-anyanwu atuwo kwa oké ujọ.
21 Otú ọ di, ndia bu ebe-obibi nke ajọ omume,
Nka bu kwa ebe onye nāmaghi Chineke.