Job
Isi 41
Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi?
Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?
2 Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya?
Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?
3 Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara?
Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?
4 Ò gēso gi b͕a ndu?
Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?
5 Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu?
Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?
6 Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia?
Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia?
7 Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya?
Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?
8 Tukwasi ya ọbu-aka-gi;
Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.
9 Le, nchere-ya bu ihe-ugha:
Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?
10 Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya:
Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?
11 Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi?
Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.
12 M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru,
Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.
13 Ònye kpugheworo iru uwe-ya?
Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?
14 Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?
Ezé-ya di oké ujọ buruburu.
15 Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,
Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.
16 Dika otù si nọ ibe-ya nso,
Ifufe adighi-abà n'etiti ha.
17 Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya;
Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.
18 Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,
Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.
19 N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,
Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.
20 N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,
Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.
21 Iku-ume-ya nāmunye icheku,
Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.
22 N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,
Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.
23 Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha:
O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.
24 Obi-ya siri ike dika nkume;
O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.
25 Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:
Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.
26 Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;
Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.
27 Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,
Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.
28 Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:
Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.
29 Anāgu ndele n'ahihia-ọka:
Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.
30 Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:
Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.
31 Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:
Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.
32 Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;
Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.
33 Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa,
Nke emeworo nēnweghi ujọ.
34 Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu:
Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.