Isi 2

Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha iguzo onwe-ya n'iru Jehova.
2 Jehova we si Setan, Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.
3 Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu.
4 Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.
5 Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.
6 Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya.
7 Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya.
8 O we were n'onwe-ya ejùjù iji kọ onwe-ya ọkọ; ya onwe-ya nānọdu kwa n'etiti ntu.
9 Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.
10 Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.
11 Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi.
12 Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di.
13 Ha na ya we nānọko n'ala ubọchi asa ehihie na abali, ma ọ dighi onye nāgwa ya okwu; n'ihi na ha huru na o nēb͕u ya nb͕u nke-uku.