Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 10

Ike ndum agwuwo nkpuru-obim; Ka m'rapuru onwem ntamum; Ka m'kwue okwu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
2 M'gāsi Chineke, Amalam ikpe; Me ka m'mara ihe kpatara I ji som se okwu.
3 Ọ̀ di Gi nma ka I meb͕ue nmeb͕u, Ka I ju ndọb͕u-n'ọlu nke ọbu-aka-Gi abua, We mukwasi ìhè na ndum-ọdu ndi nēmebi iwu?
4 Ọ̀ bu anya anu-aru ka I nwere, Ma-ọbu na I nāhu dika madu si ahu?
5 Ọ̀ bu dika ubọchi madu si di ka ubọchi-Gi di? Ma-ọbu arọ-Gi, hà di ka ubọchi madu,
6 Na I nāchọ ajọ omumem, Nāju kwa ase nmehiem?
7 Ọ bu ezie na I mara na adighm-emebi iwu; Ọ dighi kwa onye ọ bula nānaputa n'aka-Gi.
8 Aka-Gi dozirim, we kpuam Ka m'buru otù buruburu; ma I nēlodam.
9 Biko, cheta na dika urọ ka I kpuworom; Ì gēme kwa ka m'laghachi n'ájá?
10 Ọ̀ bughi dika miri-ara ka I nāwusim, Me ka m'raru araru dika cheese?
11 Akpukpọ-aru na anu-aru ka I yikwasirim, Were kwa ọkpukpu na akwara kpam dika ákwà.
12 Ndu na ebere ka I meworo ka m'nwe, Nlekọta-gi edebewo kwa mọm.
13 Ma I zoro ihe ndia n'obi-Gi; Amawom na nka di n'aka-Gi:
14 Ọ buru na emehiewom, I nēlezikwam anya, I gaghi-agupukwam n'ajọ omumem.
15 Ọ buru na emebiwom iwu, ahuhu dirim; Ọ buru kwa na abum onye ezi omume, m'gaghi-eweli isim elu; Ebe nlelìm juworom afọ, Ya na ilekwasi nwedam anya.
16 Ọ buru kwa na isim ewelie onwe-ya n'elu, dika ọdum nke nāb͕ọ uja ka I nāchu ntám: I we laghachi gosi Onwe-gi onye di ebube megidem.
17 I nēme ka ndi-àmà-Gi di ọhu n'irum, Nēme kwa ka nkpasu-iwe-Gi ba uba n'ebe m'nọ; Nb͕anwe na usu-ndi-agha di n'ebe m'nọ.
18 N'ìhi gini kwa ka I ji me ka m'si n'àkpà-nwa puta? M'gēkubìwori ume, ọ dighi kwa anya gāhum.
19 Dika agāsi na ọ dighi mb͕e m'nọ, otú a ka m'gādi; Site n'afọ nnem rue ílì ka agēbum.
20 Ùbọchim adighi ole-na-ole? rapu kwa, Dopu Onwe-gi n'ebe m'nọ, ka m'we b͕asa irum nwantī,
21 Tutu alam, ghara kwa ilaghachi, Rue ala ọchichiri, na onyinyo ọnwu;
22 Ala oké ọchichiri, dika oké ọchichiri onwe-ya; Ala onyinyo ọnwu, nke usoro nādighi ya, Ebe ọmumu-ìhè di kwa ka oké ọchichiri.