Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 23

Job we za, si,
2 Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu: Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.
3 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya! Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!
4 Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya, Meju kwa onum n'iru-uka.
5 Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim, Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.
6 Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe? É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.
7 N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka; Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.
8 Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya; M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:
9 M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya: Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.
10 N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga; Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
11 Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.
12 Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
13 Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya? Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.
14 N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm: Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.
15 N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya; Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya.
16 N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri, Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:
17 N'ihi na ekpochapughm n'iru ọchichiri, O kpuchighi kwa oké ọchichiri n'irum.