Job
Isi 38
Jehova we si n'oké ifufe za Job, si,
2 Ònye bu onye a nke nēme ka ndum-ọdu b͕a ọchichiri
Site n'okwu ọmuma-ihe nādighi?
3 Biko, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi dika onye di ike:
M'gāju kwa gi, gi me kwa ka M'mara.
4 Òle ebe i nọ mb͕e M'tọro ntọ-ala uwa?
Gosim, ma ọ buru na i mara nghọta.
5 Ònye doro ọtùtù-ya nile, ma asi na i mara?
Ma-ọbu ònye setiri eriri-ọtùtù n'elu ya?
6 N'èlu gini ka emere ka ukwu-ya nile bamie?
Ma-ọbu ònye tọb͕ọrọ nkume nkuku-ya,
7 Mb͕e kpakpando ututu nētikọ nkpu ọṅù,
Umu Chineke nile we tisie nkpu ọṅù ike?
8 Ma-ọbu ònye ji ibo-ọnu-uzọ mechibido oké osimiri,
Mb͕e ọ waputara dika agāsi na ọ nēsi n'àkpà-nwa puta;
9 Mb͕e M'doro igwe-oji ka ọ buru uwe-ya,
Na oké ọchichiri ka ọ buru ákwà-ọkiké-ya,
10 M'we kpawara ya ókèm,
Tiye ihe-ntuchi na ibo-ọnu-uzọ,
11 Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya;
N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?
12 Site na nmalite ubọchi-gi ọ̀ di mb͕e i nyere ututu iwu,
Me chi-ọbubọ ka ọ mara ọnọdu-ya;
13 Ka o we jide akuku nile nke uwa aka,
Ewe si nime ya rurupu ndi nēmebe iwu?
14 Ọ nāb͕anwe onwe-ya dka urọ akàrà;
Ha nēguzo kwa onwe-ha dika uwe:
15 Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ,
Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.
16 Ì bàwo n'ebe-nsuputa nile nke oké osimiri?
Ma-ọbu ì jeghariwo n'ebe michasiri emi nke ob͕u-miri?
17 Èkpugheworo gi ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu?
Ma-ọbu ì nāhu ọnu-uzọ-ama nke onyinyo ọnwu?
18 Ì ghọtawo rue obosara uwa?
Gosim, ma ọ buru na i nazuwo ya.
19 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe-obibi ìhè?
Ọchichiri kwa, òle ebe ọ di, bú ọnọdu-ya;
20 Nke i gēwere ya je n'ókè-ala-ya,
Nke i gāghọta kwa uzọ nile nke ulo-ya?
21 I mawo, n'ihi na mb͕e ahu ka anāmu gi,
Ọnu-ọgugu ubọchi-gi ri-kwa-ra nne!
22 Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow,
Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,
23 Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà,
Nye ubọchi ọ̀gù na agha?
24 Òle ebe ọ di, bú uzọ ebe anēkesa ìhè,
Ebe anāb͕asa ifufe ọwuwa-anyanwu n'elu uwa?
25 Ònye waworo uzọ-miri nye iju-miri,
Ma-ọbu uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe;
26 Ime ka miri zokwasi ala ebe ọ dighi onye ọ bula bi;
Bú ọzara madu nēbighi nime ya;
27 Ime ka afọ ju nkpọnkpọ-ebe nke tọb͕ọrọ n'efu;
Na ime ka o pue, bú npuputa ọhu nke ahihia ndu?
28 Miri-ozuzo, ọ̀ nwere nna?
Ma-ọbu ònye muworo nkpuru igirigi?
29 N'àfọ onye ka ice nēsi puta?
Hoar-frost nke elu-igwe kwa, ònye muworo ya?
30 N'ihe dika nkume ka miri nēzobe onwe-ha,
Iru ob͕u-miri nāraru kwa araru.
31 Ì nēkekọta iru-utọ Pleiades,
Ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion?
32 Ì nēme ka Mazzaroth puta na mb͕e-ya?
Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya?
33 Ì mawo ukpuru nile nke elu-igwe?
Ma-ọbu ì nēdo ndozi-okwu-ya n'uwa?
34 Ì nēweli olu-gi elu rue igwe-oji,
Ka njubiga miri we kpuchie gi?
35 Ì nēzipu àmùmà, ka ha we je,
Si kwa gi, Le ayi?
36 Ònye tiyeworo amam-ihe n'akuku di nime?
Ma-ọbu ònye nyeworo akọ-na-uche nghọta?
37 Ònye nāgu mbara-ígwé ọnu site n'amam-ihe?
Ma-ọbu ònye nātọb͕ọ karama-akpukpọ nile nke elu-igwe ib͕apu miri-ha,
38 Mb͕e ájá nāghọ urọ,
Mb͕e ọkpurukpu-ájá nile nārapara n'aru onwe-ha?
39 Ì nāchuru nne-ọdum anu-ndọb͕u?
Ma-ọbu ì nēme ka afọ-iri-nri umu-ọdum ju,
40 Mb͕e ha nāmakpu n'ebe-obibi-ha,
Nọdu kwa n'okwu-ọhia iche anu?
41 Ònye nēdoziri ugolo-ọma ihe-oriri-ya,
Mb͕e umu-ya nētiku Chineke, Nāwaghari nēnweghi ihe-oriri?