Isi 5

Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi? Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?
2 N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.
3 Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu: M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.
4 Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di, Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama, Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.
5 Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya, Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya, Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.
6 N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta, Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;
7 Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ, Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.
8 Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke, Chineke ka m'gēbo kwa okwum:
9 Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi; Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:
10 Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala, Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:
11 Ido ndi di ala n'ebe di elu; Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.
12 Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ, Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.
13 Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha: Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.
14 N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.
15 O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha, Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.
16 Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya, Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.
17 Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba: Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.
18 N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u, Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.
19 Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi; Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.
20 N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu; B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.
21 Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi; I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.
22 I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì; I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.
23 N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu; Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.
24 I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo; I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.
25 I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu, Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.
26 I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi, Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.
27 Le nka, ayi egwuputawo ala-ya, otú a ka ọ di; Nuru ya, gi onwe-gi mata kwa ya n'onwe-gi.