Job

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42


Isi 20

Zofa, bú onye Neama, we za, si,
2 N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim, Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.
3 Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere, Mọ nke nghọtam nāzakwam.
4 Ì mawo nka site na mb͕e ochie, Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,
5 Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?
6 Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe, Isi-ya ewe metu igwe-oji;
7 Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi: Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?
8 Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya: Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.
9 Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ; Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.
10 Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye, Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.
11 Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya, Ma o gēso ya dina n'elu ájá.
12 Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya, Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;
13 Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya, Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;
14 Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo, Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.
15 O lodawo àkù, we b͕oputa ya: Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.
16 Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya.
17 Ọ gaghi-ele miri-iyi anya, Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.
18 Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya; Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.
19 N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha; Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.
20 N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya, Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.
21 Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi; N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.
22 N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya: Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.
23 Ka o rue, n'iriju afọ-ya, Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya, Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.
24 Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga, Uta ọla gāb͕apue ya.
25 Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta: Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta; Oké ujọ nile di n'aru ya.
26 Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba: Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya; Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.
27 Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya, Ala nēbili kwa imegide ya.
28 Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ, Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya.
29 Nka bu òkè madu nke nēmebi iwu site n'aka Chineke, Na ihe-nketa-ya nke Chineke siri ya keta.