Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 48

Ma ndia bu aha ebo nile: site na nsọtu Ugwu, n'akuku uzọ Hetlon rue nbata Hemat, Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, n'akuku Ugwu n'akuku Hemat; ọ gēnwe kwa akuku Iru-anyanwu na nke Ọdida-anyanwu; Dan, otù òkè.
2 N'akuku ókè-ala Dan, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Asha, otù òkè.
3 N'akuku ókè-ala Asha, site n'akuku Iru-anyanwu we rue akuku Ọdida-anyanwu; Naftali, otù òkè.
4 N'akuku ókè-ala Naftali, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Manase, otù òkè.
5 N'akuku ókè-ala Manase, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Efraim, otù òkè.
6 N'akuku ókè-ala Efraim, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Reuben, otù òkè.
7 N'akuku ókè-ala Reuben, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku ọdida-anyanwu; Juda, otù òkè.
8 Ma n'akuku ókè-ala Juda, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu, ka àjà-nbuli nke unu gēbuli gādi, orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri bu obosara-ya, ogologo-ya gādi kwa ka otù nime òkè ndia, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu: ebe nsọ Chineke gādi kwa n'etiti ya.
9 Àjà-nbuli ahu nke unu gēbuliri Jehova, ogologo-ya gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara-ya gādi kwa orú nnù ami na nnù ise.
10 Ọ bu kwa ndia, bú ndi-nchu-àjà, gēnwe àjà-nbuli nsọ ahu; n'akuku Ugwu orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, n'akuku Ọdida-anyanwu obosara-ya di orú nnù na nnù ise, n'akuku Iru-anyanwu obosara-ya di orú nnù ise, n'akuku Ndida ogologo-ya di orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri: ebe nsọ nke Jehova gādi kwa n'etiti ya.
11 Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n'umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru.
12 Ọ gābu-kwa-ra ha àjà-nbuli sitere n'àjà-nbuli nke ala nka, ihe di nsọ kachasi ihe nsọ nile, n'ókè-ala ndi Livai.
13 Ma n'akuku ókè-ala ndi-nchu-àjà, ka ndi Livai gēnwe orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi orú nnù na nnù ise. Ogologo nile gādi orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, obosara gādi kwa orú nnù na nnù ise.
14 Ha agaghi-erepu ihe ọ bula nime ya, ha agaghi-ab͕anwe kwa ya, agaghi-eme kwa ka nkpuru mbu ala ahu gabiga n'ebe ọzọ: n'ihi na ihe nsọ ka ọ buru Jehova.
15 Ma nnù ami iri-na-abua na ọgu iri nke fọduru n'obosara-ya, n'iru orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu, ihe nādighi nsọ ka ọ gābu, ọ gādiri obodo Jerusalem, ibu ebe-obibi na ibu ebe-ita-nri: obodo gādi kwa n'etiti ya.
16 Ma ndia gābu ọtùtù-ya; akuku Ugwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, akuku Ndida nnù iri-na-otù na ọgu ise, n'akuku Iru-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, na akuku Ọdida-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise.
17 Ebe-ita-nri ka obodo ahu gēnwe kwa; n'akuku Ugwu ọgu ami iri-na-abua na iri, n'akuku Ndida ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Iru-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Ọdida-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri.
18 Ma nke fọduru n'ogologo-ya, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, gādi orú nnù ami na nnù ise n'akuku Iru-anyanwu, na orú nnù na nnù ise n'akuku Ọdida-anyanwu: ọ gādi kwa n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ; ihe-ọmume-ya gābu-kwa-ra ndi nēfè obodo òfùfè nri.
19 Ọ bu kwa ndi nēfè obodo òfùfè gālu ya ubi, bú ndi sitere n'ebo nile nke Israel.
20 Àjà-nbuli ahu nile gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'obosara: ihe nke nwere akuku anọ rara nrata, otú a ka unu gēbuli àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, tiyere ihe-onwunwe nke obodo.
21 Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n'akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n'etiti ya.
22 Ọzọ, site n'ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n'ihe-onwunwe nke obodo, n'etiti ala nke onye-isi nwere, n'etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu.
23 Ma ebo nile nke fọduru: site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Benjamin, otù òkè.
24 N'akuku ókè-ala Benjamin, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Simeon, otù òkè.
25 N'akuku ókè-ala Simeon, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Isaka, otù òkè.
26 N'akuku ókè-ala Isaka, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè.
27 N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè.
28 Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku.
29 Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n'ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
30 Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù:
31 ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n'akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù:
32 n'akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù:
33 n'akuku Ndida kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù; na ọnu-uzọ-ama atọ: ọnu-uzọ-ama Simeon, otù; ọnu-uzọ-ama Isaka, otù; ọnu-uzọ-ama Zebulun, otù:
34 n'akuku Ọdida-anyanwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise, na ọnu-uzọ-ama atọ ha: ọnu-uzọ-ama Gad, otù; ọnu-uzọ-ama Asha, otù; ọnu-uzọ-ama Naftali, otù.
35 Buruburu-ya gādi orú nnù ami uzọ abua na nnù ise: ma aha obodo ahu site n'ubọ̀chi ahu gābu, Jehova nọ n'ebe ahu.