Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 3

O we sim, Nwa nke madu, ihe ahu nke i nāhu, rie ya; rie akwukwọ-npiakọta ahu, je, gwa ulo Israel okwu.
2 M'we saghepu ọnum, O we me ka m'rie akwukwọ-npiakọta ahu.
3 O we sim, Nwa nke madu, me ka afọ-gi rie, ọ bu kwa ngiri-afọ-gi nile ka i gēmeju n'akwukwọ-npiakọta nka nke Mu onwem nēnye gi. M'we rie; o we di n'ọnum dika manu-aṅu n'utọ.
4 O we sim, Nwa nke madu, je, ba n'ulo Israel, were okwum nile gwa ha.
5 N'ihi na ọ bughi ijekuru ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́ ka ezigaworo gi onwe-gi, ma ọ bu ijekuru ulo Israel;
6 ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N'ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M'zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti.
7 Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu.
8 Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha.
9 Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
10 O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua.
11 Je kwa, bakuru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bakuru umu ndi-gi, gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; ma ha gānu, ma ha gāghara.
12 Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya.
13 M'we nu olu nke nkù nile nke ihe anọ ahu di ndu ka ha nēmeturita ibe-ha, na olu wheel nile nke di n'akuku ha, ọbuná olu nke oké ùzù.
14 Mọ Chineke we buliem, bupum: m'we jegharia n'ilu obi, n'ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n'arum di ike.
15 M'we biakute ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ, na Tel-abib, bú ndi bi n'akuku osimiri Keba, m'we biarue ebe ha onwe-ha bi; m'we nọdu n'ebe ahu ubọchi asa n'anya o nējum n'etiti ha.
16 O rue, n'ọgwugwu ubọchi asa, na okwu Jehova rurum nti, si,
17 Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.
18 Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.
19 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti, ma o sighi na nmebi-iwu-ya na n'uzọ nmebi-iwu ya chigharia, onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.
20 Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.
21 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ ya, bú onye ezi omume, aka na nti, ka onye ezi omume ghara imehie, onye ahu we ghara imehie, ọ ghaghi idi ndu, n'ihi na adọrọ ya aka na nti; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.
22 Aka Jehova we dim n'aru n'ebe ahu; O we sim, Bilie, pua, jerue ndagwurugwu, n'ebe ahu ka M'gākpayere gi uka.
23 M'we bilie, pua, jerue ndagwurugwu ahu: ma, le, n'ebe ahu ka ebube Jehova nēguzo, dika ebube nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpue irum n'ala.
24 Mọ Chineke we bata nimem, me ka m'guzo n'ukwum abua; O we kpayerem uka, sim, Bia, mechibido onwe-gi uzọ n'etiti ulo-gi.
25 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, le, ha gātukwasi gi udọ̀ n'aru, chiri ha ke gi ab͕u, i gaghi-apu kwa n'èzí n'etiti ha:
26 M'gēme kwa ka ire-gi rapara n'okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
27 Ma mb͕e M'nākpayere gi uka, M'gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.