Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 15

Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, gini ka osisi vine bu kari osisi ọ bula, bú alaka vine nke diworo n'etiti osisi nile nke oké ọhia?
3 Àgēsi nime ya were osisi ime ihe ije ozi? ma-ọbu àgēsi nime ya were nkpukpọ ikokwasi ihe ọ bula n'elu ya?
4 Le, n'ọku ka atubàworo ya ibu nri-ya: isi-ya abua ka ọku ripiaworo, etiti-ya anujiwo kwa; ọ̀ gābà n'ije-ozi ọ bula?
5 Le, mb͕e o zuru okè, adighi-ewere ya me ihe ije ozi: àgēsi kwa aṅa were ya me ihe ije ozi ọzọ, mb͕e ọku ripiaworo ya, o we nujie?
6 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: dika osisi vine si di n'etiti osisi oké ọhia, nke M'nyeworo ọku ibu nri-ya, otú a ka M'nyeworo ndi bi na Jerusalem.
7 M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.
8 M'gēme kwa ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na ha emekpuwo ihe-nmekpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.