Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 6

Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, che iru-gi n'ugwu nile nke Israel, bu amuma megide ha,
3 si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile: Le, Mu onwem nēme ka mma-agha biakwasi unu, M'gēme kwa ka ha la n'iyì, bú ebe nile unu nke di elu.
4 Agēme kwa ka ebe-ichu-àjà nile unu tọb͕ọrọ n'efu, agētipia kwa arusi-anyanwu nile unu: M'gēme kwa ka ndi-unu eb͕uru eb͕u da n'iru arusi nile unu.
5 M'gātọb͕ọ kwa ozu nile nke umu Israel n'iru arusi nile ha; M'gātusa kwa ọkpukpu-unu buruburu ebe-ichu-àjà nile unu.
6 N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.
7 Onye eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti unu, unu we mara na Mu onwem bu Jehova.
8 Ma M'gēme ka madu ufọdu fọdu, ọ bu na unu gēnwe ndi b͕apuru na mma-agha n'etiti mba nile, mb͕e unu gāb͕asa n'ala nile.
9 Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.
10 Ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: ọ bughi n'efu ka M'kwuworo okwu, si na M'gēme ha ihe ọjọ a.
11 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n'ala, si, Éwù! n'ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n'ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n'oké unwu, site kwa n'ajọ ọria nke nēfe efe, da.
12 Onye nọ n'ebe di anya gēsite n'ajọ ọria nēfe efe nwua; onye nọ nso gēsite na mma-agha da; onye fọduru nke anānọchigide kwa n'agha gēsite n'oké unwu nwua: M'we mezue ọnumam n'aru ha.
13 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n'etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n'ugwu ntà ọ bula di elu, na n'elu ugwu nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, na n'okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ.
14 M'gēseti kwa akam n'aru ha, me ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, site n'ọzara rue Dibla, n'ebe-obibi nile ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.