Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 31

O rue, n'arọ nke-iri-na otù, n'ọnwa nke-atọ, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
2 Nwa nke madu, Si Fero, bú eze Ijipt, si kwa ìgwè ndi-ya; Ònye ka i yiri n'idi-uku-gi?
3 Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.
4 Miri mere ya ka o bùe ibù, ob͕u-miri mere ya ka ọ di elu: osimiri-ya nile nāga ebe-ya akuku ihe buruburu; uzọ-miri-ya nile ka o zigara osisi nile nke ọhia.
5 N'ihi nka ka ogologo-ya di elu kari osisi nile nke ọhia; eme-kwa-ra ka ngalaba-ya ba uba, alaka-ya nile to-kwa-ra ogologo site n'ọtutu miri, mb͕e ọ waputara ha.
6 Na ngalaba-ya nile ka anu-ufe nile nke elu-igwe luru akwu, ọ bu kwa n'okpuru alaka-ya nile ka anu ọhia nile muru umu, ọ bu kwa na ǹdò-ya ka oké mba nile biri.
7 Ọ we ma nma n'idi-uku-ya, n'ogologo nke alaka-ya nile: n'ihi na nkpọrọgwu-ya adiwo n'ebe ọtutu miri di.
8 Osisi cedar nile nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n'ima-nma-ya.
9 Ihe nke mara nma ka M'mere ya ka ọ ghọ n'iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n'ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo.
10 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya;
11 M'gēnye kwa ya n'aka onye di ike nke mba nile; ọ ghaghi imeso ya: n'ihi nmebi-iwu-ya ka M'chupuworo ya.
12 Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.
13 N'elu ihe-ya dara ada ka anu-ufe nile nke elu-igwe gēbi, ọ bu kwa n'alaka-ya nile ka anu ọhia nile gādi:
14 ka osisi nile nke miri we ghara idi elu n'ogologo-ha, ghara kwa itiye ọnu-ọnu-ha rue etiti alaka b͕ara ọhia, ka ndi-ha ndi di ike we ghara iguzo n'idi-elu-ha, bú ndi nile nāṅu miri: n'ihi na ha nile ka ewereworo nye ọnwu, ijeru ala di n'okpuru uwa, n'etiti umu nke madu, ijekuru ndi nārida n'olùlù.
15 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi mb͕e ọ ridaruru n'ala-mọ emerem ka erue újú: ekpuchirim ob͕u-miri n'ihi ya, eb͕ochi-kwa-ram osimiri-ya nile, ewe b͕ochibido ọtutu miri: eme-kwa-ram ka Lebanon yiere ya uwe-nkpe, osisi nile nke ọhia tubọ-kwa-ra atubọ n'ihi ya.
16 Emerem ka mba nile me nkpatu site n'olu nke ọdida-ya, mb͕e M'mere ka ọ ridarue ala-mọ, ya na ndi nārida n'olùlù: ewe kasie osisi nile nke Iden obi n'ala di n'okpuru uwa, bú osisi arọputara arọputa kachasi kwa nma na Lebanon, ndi nile nke nāṅu miri.
17 Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n'etiti mba nile.
18 Ònye ka i yiri otú a nime nsọpuru na n'idi-uku n'etiti osisi nile nke Iden? ma emewo ka i rida, gi na osisi nile nke Iden, rue ala di n'okpuru uwa: n'etiti ndi anēbighi úgwù ka i gēdina, gi na ndi ejiri mma-agha b͕u. Nka bu Fero-na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.