Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 24

Okwu Jehova we ruem nti n'arọ nke-iteghete, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, si,
2 Nwa nke madu, dere onwe-gi aha nke ubọchi a, bú ubọchi nke ta: eze Babilon kwagidere Jerusalem n'ubọchi nke ta.
3 Tu-kwa-ra ulo nnupu-isi ahu ilu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Sikwasi ite ahu, sikwasi ya, ọzọ kwa, b͕aye ya miri:
4 chikọta anu-ya abọrọ abọ nime ya, bú ọbubọ ọ bula di nma, utaku-ukwu, na ọlu-aka; kpojue ya n'ọkpukpu arọputara arọputa.
5 Were aturu arọputara arọputa n'ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n'okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n'etiti ya.
6 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu, bú ite nke nchara-ya di nime ya, nke nchara-ya nāpughi nime ya! weputa ya n'ọbubọ n'ọbubọ; nzà amaghi ya.
7 N'ihi na ọbara-ya adiwo n'etiti ya; n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n'ala, ikpuchi ya ájá;
8 ka o we me ka ọnuma rigota ibọ̀ ọ́bọ̀, ya ka M'ji tiye ọbara-ya n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya, ka ewe ghara ikpuchi ya.
9 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu! Mu onwem gēme kwa ka obo-ya di uku.
10 Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile.
11 Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.
12 O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n'ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n'ọku ka nchara-ya di.
13 N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.
14 Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M'gēme kwa ya; M'gaghi-arapu, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15 Okwu Jehova we ruem nti, si,
16 Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.
17 Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n'isi-gi n'onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n'ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ.
18 M'we gwa ndi Israel okwu n'ututu; nwunyem we nwua n'anyasi: m'we me n'ututu dika ihe ahu si di enyerem n'iwu.
19 Ndi Israel we sim, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe ayi nọ, na gi onwe-gi nēme otú a?
20 M'we si ha, Okwu Jehova rurum nti, si,
21 Si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ebe nsọm ghara idi nsọ, bú ihe-npako nke ike-unu, na ihe anya-unu abua nāchọsi ike, na ihe nke nkpuru-obi-unu nwere ọmiko n'aru ya; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom, ndi unu rapuworo, gāda kwa site na mma-agha.
22 Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.
23 Ihe-ike-n'isi-unu gādi kwa unu n'isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n'ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n'obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n'ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude.
24 Ezikiel ewe ghọrọ unu ihe-ebube; dika ihe nile nke o meworo si di, otú a ka unu gēme: mb͕e nka gābia, unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.
25 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi mb͕e M'napuru ha ebe-ha siri ike, bú ihe-obi-utọ nke ima-nma-ha, na ihe anya-ha abua nāchọsi ike, na ihe ha buliworo nkpuru-obi-ha nye, bú umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,
26 ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi ahu na onye b͕apuru ab͕apu gābiakute gi, ime ka i were nti-gi abua nu ya?
27 N'ubọchi ahu ka agāsaghe ọnu-gi n'ebe onye b͕apuru ab͕apu nọ, i gēkwu kwa okwu, ghara ida kwa ob͕i ọzọ: i we ghọrọ ha ihe-ebube; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.