Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 2

Ọ we sim, Nwa nke madu, guzo n'ukwu-gi abua, M'gāgwa kwa gi okwu.
2 Mọ Chineke we bata nimem mb͕e Ọ gwaram okwu, we me ka m'guzo n'ukwum abua; m'we nu otù Onye nāgwam okwu.
3 O we sim, Nwa nke madu, Mu onwem nēziga gi jekuru umu Israel, jekuru mba di iche iche ndi nānupu isi, ndi nupuworo isi n'okpurum: ha onwe-ha na ndi bu nna-ha ejehiewo megidem, rue n'ubọchi nke ta.
4 Umu-ha bu kwa ndi nēnweghi ihere n'iru, ndi obi-ha di ike; Mu onwem nēziga gi jekuru ha: i gāsi kwa ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri.
5 Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu,) ha gāmara na onye-amuma anọwo n'etiti ha.
6 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
7 I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.
8 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, nu ihe Mu onwem nāgwa gi; abula onye nānupu isi dika ulo ahu nke nānupu isi: saghepu ọnu-gi, rie ihe ahu nke Mu onwem nēnye gi.
9 M'we hu, ma, le, otù aka nke esetipuru nyem; ma, le, nime ya ka akwukwọ-npiakọta di;
10 O we b͕asa ya n'irum; ma edere ya-ri ihe n'iru na azu: ma ihe edere ya-ri nime ya bu abù-ákwá di iche iche, na isu-udè, na ahuhu.