Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 47

O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.
2 O we me ka m'si uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu n'akuku Ugwu puta, o we me ka m'ga buruburu n'uzọ di n'èzí rue ọnu-uzọ-ama di n'èzí, n'uzọ nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma le, miri nēsi n'akuku aka-nri rùputa nke-ntà nke-ntà.
3 Mb͕e nwoke ahu puru ga n'Iru-anyanwu jide eriri n'aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu.
4 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru ikperè-ukwu. O we tùa nnù cubit abua na ọgu íri, me ka m'gabiga, ọ bu miri nke ruru úkwù.
5 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri; ọ bu osimiri nke m'nāpughi igabiga: n'ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgaghi-agabiga.
6 O we sim, Ì huwo nka, nwa nke madu? O we me ka m'je, ọ we me ka m'laghachi n'usọ osimiri ahu.
7 Mb͕e m'laghachiri, le, n'usọ osimiri ahu ka ọtutu osisi nke bara uba nke-uku di, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.
8 O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n'Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya.
9 Ọ gēru kwa, na anu nile ọ bula nke nwere nkpuru-obi di ndu gādi ndu, bú nke nēnuputa enuputa, n'ebe ọ bula osimiri abua ndia gērute; azù nke bara uba nke-uku gādi kwa: n'ihi na miri ndia eruwo n'ebe ahu, ewe gwọ miri nke oké osimiri ahu, ihe nile ọ bula gādi kwa ndu n'ebe osimiri ahu gērute.
10 Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n'akuku ya: site n'En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku.
11 Ma ebe-ya nile nke bu nání apiti, na ọdọ-miri-ya nile, agaghi-agwọ ha; nnú ka agārara ha nye.
12 Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.
13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Nka gābu ókè-ala, nke unu gēsi ketara onwe-unu ala nka dika ebo iri na abua nke Israel si di: Josef gēnweta òkè ala di iche iche.
14 Unu gēketa kwa ya, otù onye dika nwa-nne-ya; n'ihi na ewelirim akam inye ya nna-unu-hà: ala nka gādaye n'aka-unu n'ihe-nketa.
15 Nka gābu kwa ókè-ala nke ala-unu: n'akuku Ugwu, site n'oké osimiri uku, n'uzọ Hetlon, rue nbata Zedad;
16 Hemat, Berota, Sibraim, nke di n'etiti ókè-ala Damaskọs na ókè-ala Hemat; Haza-hatikon, nke di n'ókè-ala Hauran.
17 Ókè-ala site n'oké osimiri gābu kwa Haza-inon n'ókè-ala Damaskọs, ma n'Ugwu n'akuku Ugwu bu ókè-ala Hemat. Nka bu kwa akuku Ugwu.
18 Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.
19 Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb.
20 Ma akuku Ọdida-anyanwu gābu oké osimiri uku, site n'ókè-ala Ndida rue na ncherita-iru nbata Hemat. Nka bu akuku Ọdida-anyanwu.
21 Unu ewe ketara onwe-unu ala nka dika ebo nile nke Israel si di.
22 Ọ gēru kwa, na unu gēme ka ọ dayere unu n'ihe-nketa, ka ọ daye-kwa-ra ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti unu, ndi muworo umu n'etiti unu: ha gādi kwa unu dika ndi amuru n'ala n'etiti umu Israel; ha gēso unu dabà n'ihe-nketa n'etiti ebo nile nke Israel.
23 Ọ gēru kwa na, n'ebe ahu nke ọbìa nọ dika ọbìa nime ya, n'ebe ahu ka unu gēnye ya ihe-nketa-ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.