Ezikiel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48


Isi 4

Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi otù brick, tọb͕ọ ya n'iru gi, kà otù obodo n'elu ya, bú Jerusalem:
2 tiye ihe-nnọchigide-n'agha imegide ya, wue ulo-agha imegide ya, wukọta obo-ihe imegide ya; tiye ọmuma-ulo-ikwū di iche iche imegide ya, do ihe di iche iche itipú mb͕idi imegide ya buruburu.
3 Gi onwe-gi were kwa n'onwe-gi ite ígwè ighe ihe, tiye ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n'etiti gi na obodo ahu: che ya iru, ewe nānọchigide ya n'agha, i gānọchigide kwa ya n'agha. Ihe-iriba-ama ka ọ gāburu ulo Israel.
4 Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha.
5 Ma Mu onwem, edoworom i arọ nile nke ajọ omume-ha ibu ọnu-ọgugu ubọchi, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri: i gēbu kwa ajọ omume nke ulo Israel.
6 Ọzọ, mb͕e i dinazuworo ubọchi ndia, i gēwere kwa akuku aka-nri gi dina ala, we buru ajọ omume nke ulo Juda: ọgu ubọchi abua, otù ubọchi n'ọnọdu otù arọ, ka M'nyeworo gi.
7 Ọ bu kwa n'ebe nnọchigide Jerusalem n'agha ahu di ka i gēche iru-gi, ogwe-aka-gi ab͕awo kwa ọtọ; i gēbu kwa amuma megide ya.
8 Ma, le, atukwasim i udọ̀, i we ghara isi n'otù akuku-aru-gi chighari n'akuku-aru-gi ọzọ, rue mb͕e i dinazuworo ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha-gi.
9 Ọzọ, gi onwe-gi were n'onwe-gi ọka wheat, na ọka barley, na akidi, na lentil, na ọka millet, na spelt, tiye ha n'otù ihe, were ha mere onwe-gi achicha; ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke gi onwe-gi were akuku-gi dina ala, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri, ka i gēri ya.
10 Ọzọ, ihe-oriri-gi nke i gēri, aganātù ya atù, orú shekel gādiri otù ubọchi: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gēri ya.
11 Ọ bu kwa miri nke anātù atù ka i gāṅu, otù uzọ n'uzọ iri nke otù hin: site n'otù mb͕e rue mb͕e ọzọ ka i gāṅu ya.
12 Ọzọ, dika ob͕e achicha barley ka i gēri ya, achicha ahu ka i gēji kwa ǹsí madu nyuru sie n'anya-ha.
13 Jehova we si, Ọbuná otú a ka umu Israel gēri nri-ha ruru árú, n'etiti mba nile ebe M'gāchuga ha.
14 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum.
15 O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya.
16 O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha:
17 ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.