Daniel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12


Isi 1

N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Jehoiakim, bú eze Juda, ka Nebukadneza, bú eze Babilon, biara na Jerusalem, nọchigide ya n'agha.
2 Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya.
3 Eze ahu we si Ashpenaz, bú onye-isi ndi-onozi-ya, ka o me ka ufọdu n'umu Israel bata, bú ufọdu nime nkpuru ala-eze na nime ndi-isi;
4 bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n'aru, ndi mara nma n'ile anya, nwe uche n'amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n'ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea.
5 Eze we keputara ha òkè nke ubọchi ọ bula n'ubọchi-ya site n'ihe-oriri ọma nke eze, na site na manya-vine nke ọ nāṅu, si ka eme ka ha toputa arọ atọ, ka ha we guzo n'iru eze n'ọgwugwu arọ atọ ahu.
6 Ma n'etiti ha ka umu Juda ufọdu di, bú Daniel, na Hananaia, na Mishael, na Azaraia.
7 Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.
8 Daniel we tiye nka n'obi-ya na ọ gaghi-ewere ihe-oriri ọma eze ma-ọbu manya-vine ọ nāṅu me onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ: o we chọ n'aka onye-isi ndi-onozi ka ọ ghara ime onwe-ya onye nādighi nsọ.
9 Chineke we nye Daniel ka enwe ebere na obi-ebere nile n'aru ya n'iru onye-isi ndi-onozi.
10 Onye-isi ndi-onozi we si Daniel, Mu onwem nātu egwu onye-nwem, bú eze, onye keputaworo ihe-oriri-unu na ihe-ọṅuṅu-unu: n'ihi na ọ̀ bú n'ihi gini ka ọ gāhu iru-unu ka ha b͕aruru kari iru umu-okoro ndi-ọb͕ọ-unu? unu ewe me ka eze nara isim na nrà.
11 Daniel we si onye-nlekọta, nke onye-isi ndi-onozi mere ka ọ guru onye-isi Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia:
12 Biko, nānwa ndi-orù-gi ubọchi iri; ka ha nye kwa ayi akukú ufọdu, ayi ewe rie, ka ha nye kwa ayi miri, ayi ewe ṅua.
13 Ka ahú kwa otú ayi di n'iru gi n'ile ayi anya, na otú umu-okoro ndi nēri ihe-oriri ọma eze di n'ile ha anya; ma dika i si hu, meso ndi-orù-gi otú a.
14 O we ge ha nti n'okwu a, we nwa ha ubọchi iri.
15 N'ọgwugwu ubọchi iri ewe hu na ha di nma n'ile ha anya, ha ma-kwa-ra abuba n'anu-aru, kari umu-okoro ahu nile ndi nēri ihe-oriri ọma eze.
16 Onye-nlekọta ahu we nēwepu ihe-oriri ọma ha na manya-vine ha ganāṅu, o we nēnye ha akukú.
17 Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.
18 Ma n'ọgwugwu ubọchi ndia nke eze siri ka eme ka ha bata, onye-isi ndi-onozi we me ka ha bata n'iru Nebukadneza.
19 Eze we kpayere ha uka; ma ahughi n'etiti ha nile onye ọ bula di ka Daniel na Hananaia na Mishael na Azaraia: ha we guzo n'iru eze.
20 Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.
21 Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.