Daniel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12


Isi 10

N'arọ nke-atọ nke Sairọs, bú eze Peasia, ekpughere Daniel, onye akpọrọ aha-ya Belteshaza, okwu; ọ bu kwa ezi-okwu ka okwu ahu bu, ọbuná obubu-agha uku: o we ghọta okwu ahu, nghọta di-kwa-ra ya n'ọhù ahu.
2 N'ubọchi ahu mu onwem, bú Daniel, nọ nēru újú ogologo ízù atọ.
3 Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru.
4 Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa mbu, mb͕e mu onwem nọ n'akuku osimiri uku ahu, ya bu Hidekel,
5 m'we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n'úkwù-ya:
6 aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n'ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu.
7 Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha.
8 Mu onwem we fọduru náním, m'we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n'ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n'arum, m'we ghara inagide ike ọ bula.
9 M'we nu olu okwu-ya nile: ma mb͕e m'nuru olu okwu-ya nile mu onwem adawori n'oké ura kpue irum n'ala, irum we che n'ala.
10 Ma, le, otù aka meturum, me ka m'guzo nāṅaghari n'elu ikperèm abua na ọbu-akam abua.
11 O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n'ebe-nguzo-gi; n'ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m'we guzo ọtọ nāma jijiji.
12 O we sim, Atula egwu, Daniel; n'ihi na site n'ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n'ala n'iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n'ihi okwu-gi nile.
13 Ma onye-isi ala-eze Peasia nēguzo na ncherita-irum orú ubọchi na otù; ma, le, Maikael, bú otù nime ndi-isi ndi bu isi, biara iyerem aka: mu onwem we fọdu n'ebe ahu n'akuku ndi-eze Peasia.
14 Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.
15 Mb͕e ọ kpayerem uka dika okwu ndia si di, m'we che irum n'ala, da ob͕i.
16 Ma, le, otù onye nke di ka oyiyi umu nke madu nēmetu eb͕ub͕ere-ọnum abua aka: m'we saghe ọnum, kwue okwu, si onye ahu nke nēguzo na ncherita-irum, Onye-nwem, site n'ọhù a aru-ufum nile dakwasirim na mberede, m'we ghara inagide ike ọ bula.
17 Òrù nke onye-nwem nka gēsi kwa aṅa nwe ike ikpayere onye-nwem nka uka? ma mu onwem, site n'ub͕u a ike adighi-eguzogide kwa nimem, ume afọdughi kwa nimem.
18 Otù onye nke di ka madu n'ile ya anya we metukwam aka ọzọ, me ka m'di ike.
19 O we si, Atula egwu, gi onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku: udo diri gi, di ike, e, di ike. Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we me onwem ka m'di ike, si, Ka onye-nwem kwue; n'ihi na i mewo ka m'di ike.
20 O we si, Ì mara ihe m'jiri biakute gi? ma ub͕u a m'gālaghachi ibuso onye-isi Peasia agha: ma mb͕e mu onwem nāpu, le, onye-isi Jevan gābata.
21 Ma otú ọ di, m'gēgosi gi ihe akara àkà n'ihe edere n'akwukwọ nke ezi-okwu: ma ọ dighi otù onye nēme onwe-ya ka ọ di ike n'akukum imegide ndia, ma-ọbughi nání Maikael, bú onye-isi ūnu.