Daniel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12


Isi 8

N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Belshaza, bú eze, emere ka m'hu ọhù, bú mu onwem Daniel, mb͕e ọhù ahu nke emere ka m'hu ya n'isi-nmalite gasiri.
2 M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.
3 M'we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n'iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute.
4 Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.
5 Ma mu onwem nọ nāchighari uchem, ma, le, otù nkpi siri n'Ọdida-anyanwu bia n'elu uwa nile, ma ọ dighi-emetu ala ma-ọli: nkpi ahu nwe-kwa-ra mpi juru anya n'olile n'etiti anya-ya abua.
6 O we biakute ebulu ahu nke nwere mpi abua, nke m'huru ka ọ nēguzo n'iru osimiri ahu, o we b͕akwasi ya ọsọ n'ọnuma nke ike-ya.
7 M'we hu ya ka ọ nābiarutu ebulu ahu nso, o we wesa ya iwe di ilu, tib͕ue ebulu ahu, sọjie mpi-ya abua; ike adighi kwa ebulu ahu iguzo n'iru ya, o we tuda ya n'ala, zọda ya ukwu; ọ dighi kwa onye nānaputa ebulu n'aka-ya.
8 Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n'olile we pute n'ọnọdu ya chere iru n'ifufe anọ nke elu-igwe.
9 Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n'uzọ Ndida, na n'uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n'uzọ ala ahu mara nma.
10 O we di uku rue usu ihe nile nke elu-igwe; o we me ka ufọdu nime usu ihe nile nke elu-igwe na nime kpakpando da n'ala, o we zọda ha ukwu.
11 Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.
12 Anēnye kwa ya usu-ndi-agha imegide àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum n'ihi nmehie; o we tuda ezi-okwu n'ala, me ihe, ihe ga-kwa-ra ya.
13 M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?
14 O we sim, Rue nnù anyasi na ututu ise na ọgu iri-na-ise; ewe gua ebe nsọ n'ebe ezi omume.
15 O rue, mb͕e m'huru ọhù ahu, ọbuná mu onwem, bú Daniel, na m'chọrọ nghọta; ma, le, ihe di ka nwoke di ike n'ile ya anya nēguzo n'irum.
16 M'we nu olu madu n'etiti Ulai, o we kpọ, si, Gebriel, me ka onye a ghọta ọhùa.
17 O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.
18 Mb͕e ọ kpayerem uka, m'we di n'oké ura da kpue irum n'ala: o we metum aka, me ka m'guzo ọtọ n'ebe m'nēguzo.
19 O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.
20 Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.
21 Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.
22 Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya.
23 Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.
24 Ike-ya gēsi kwa ike, ma ọ bughi n'ike nke aka ya; ọ gēbibi kwa n'uzọ di ebube, ihe gāga-kwa-ra ya nke-ọma, ọ gēme kwa ihe: ọ gēbibi kwa ndi nwere ume na ndi ahu, bú ndi nsọ.
25 Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.
26 Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n'ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n'iru.
27 Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.