I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 31

Ma ndi Filistia nēbuso Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.
2 Ndi Filistia we sosie Sọl na umu-ya ndikom ike; ndi Filistia we tib͕ue Jonatan, na Abinadab, na Malki-shua, bú umu-ndikom Sọl.
3 Agha ahu we di arọ́ megide Sọl, ndi-ọb͕a-uta we huta ya, bú ndikom chiri uta; ọ we nēb͕u ya nb͕u nke-uku site n'ib͕a-uta nke ndi-ọb͕a-uta.
4 Sọl we si onye nēbu ihe-agha-ya, Miputa mma-agha-gi, were ya mapuem aru; ka ndia anēbìghi úgwù ghara ibia mapuem aru, we kwam emò. Ma onye nēbu ihe-agha-ya ekweghi; n'ihi na ọ nātu egwu nke-uku. Sọl we were mma-agha-ya, dakwasi ya.
5 Onye nēbu ihe-agha-ya we hu na Sọl anwuwo, ya onwe-ya we dakwasi kwa na mma-agha-ya, soro ya nwua.
6 Sọl we nwua, ya na umu-ya ndikom atọ na onye nēbu ihe-agha-ya na ndikom-ya nile n'otù, n'ubọchi ahu.
7 Ndikom Israel ndi nọ n'ofè ọzọ ndagwurugwu ahu, na ndi nọ n'ofè Jọdan, we hu na ndikom Israel ab͕alagawo, hu kwa na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo, ha we rapu obodo nile ha, b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.
8 O rue, n'echi-ya, mb͕e ndi Filistia biara iyipu ihe ndi eb͕uru eb͕u, na ha huru Sọl na umu-ya ndikom atọ ka ha tọb͕ọrọ n'ugwu Gilboa.
9 Ha we bipu isi-ya, yipu ihe-agha-ya, ziga n'ala ndi Filistia buruburu, izisa ozi ahu n'ulo arusi nile ha, na n'etiti ndi-ha.
10 Ha we dọba ihe-agha-ya n'ulo Ashtarot: ma ha kpọgidere ozu-ya na mb͕idi Bet-shan.
11 Ndi bi na Jebesh-gilead we nu ihe bayere ya, bú ihe ndi Filistia mere Sọl,
12 ndikom nile bú dìnkpà we bilie, je ije ogologo abali ahu nile, si na mb͕idi Bet-shan buru ozu Sọl na ozu umu-ya ndikom; ha we biarue Jebesh, sure ha ọku n'ebe ahu.
13 Ha we chiri ọkpukpu-ha, lìe ha n'okpuru osisi tamarisk nime Jebesh, bue ọnu ubọchi asa.