I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 18

O rue, mb͕e ọ gwabìri Sọl okwu, na ekekọtara nkpuru-obi Jonatan na nkpuru-obi Devid, Jonatan we hu ya n'anya dika nkpuru-obi-ya.
2 Sọl we nara ya n'ubọchi ahu, o kweghi kwa ka ọ laghachi n'ulo nna-ya.
3 Jonatan na Devid we b͕a ndu, n'ihi na ọ huru ya n'anya dika nkpuru-obi-ya.
4 Jonatan we yipu uwe-nwuda nke di n'aru ya, nye ya Devid, na uwe-ya nile, ọbuná rue mma-agha-ya, ru kwa uta-ya, ru kwa ihe-ike-n'úkwù-ya.
5 Devid we nāpu je ebe ọ bula Sọl nēziga ya, o nwe-kwa-ra uche: Sọl we do ya onye-isi ndikom agha, o we di nma n'anya ndi Israel nile, di kwa nma n'anya ndi-orù Sọl.
6 O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe.
7 Ndinyom we zarita onwe-ha, bú ndi nēgwuri egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise.
8 Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze.
9 Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n'ubọchi ahu ga n'iru.
10 O rue, n'echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n'ike, o we bū amuma n'etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n'aka Sọl.
11 Sọl we tua ube ahu; ọ si, M'gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n'iru ya pua ub͕ò abua.
12 Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya.
13 Sọl we si n'ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n'iru ndi Israel.
14 Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya.
15 Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya.
16 Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha.
17 Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.
18 Devid we si Sọl, Ònye ka m'bu, gini bu kwa ndum, ma-ọbu ab͕uru nnam n'Israel, na m'gāburu eze di nwa-ya?
19 O rue, na mb͕e agēwere Mirab nwa Sọl nye Devid, na nwayi ahu ka enyere Adriel, bú onye Mehola, na nwunye.
20 Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, huru Devid n'anya: ha we gosi Sọl, ihe ahu ziri ezi n'anya-ya.
21 Sọl we si, M'gēnye ya ya, ka o we ghọrọ ya ọnyà, ka aka ndi Filistia we di n'aru ya. Sọl we si Devid, Nke ub͕ò abua ka i gāburum di nwam ta.
22 Sọl we nye ndi-orù-ya iwu, si, Gwanu Devid okwu na nzuzo, si, Le, ihe-gi nātọ eze utọ, ndi-orù-ya nile hu-kwa-ra gi n'anya: ma ub͕u a buru di nwa eze.
23 Ndi-orù Sọl we kwue okwu ndia na nti Devid. Devid we si, Ọ̀ bu ihe di nfe n'anya-unu ibu di nwa eze, ebe mu onwem bu ob͕eye na onye anākpọghi ihe?
24 Ndi-orù Sọl we gosi ya, si, Dika okwu ndia si di ka Devid kwuru.
25 Sọl we si, Otú a ka unu gāsi Devid, Ọ dighi ego-ilu-nwunye gātọ eze utọ, kama ọgu api ise nke ndi Filistia, ka o we bọrọ onwe-ya ọ́bọ̀ n'aru ndi-iro eze. Ma Sọl chère ime ka Devid da ada n'aka ndi Filistia.
26 Ndi-orù-ya we gosi Devid okwu ndia, ma ihe ahu ziri ezi n'anya Devid, bú ka ọ buru di nwa eze. Ma ubọchi nile akēzughi;
27 Devid we bilie, je, ya onwe-ya na ndikom-ya, o we tib͕ue ọgu ndikom iri n'etiti ndi Filistia; Devid we chita api-ha, ha we nye ha eze n'ọnu-ọgugu zuru ezu, ka o we buru di nwa eze. Sọl we nye ya Maikal nwa-ya na nwunye.
28 Sọl we hu mara kwa na Jehova nọyere Devid; Maikal nwa Sọl hu-kwa-ra ya n'anya.
29 Sọl we nātu egwu Devid kari; Sọl we buru onye-iro Devid ubọchi-ya nile.
30 Ndi-isi ndi Filistia we puta: o rue, mb͕e ọ bula ha nāputa, na Devid nwere uche kari ndi-orù nile nke Sọl; aha-ya we di oké ọnu-ahia nke-uku.