I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 30

O rue, mb͕e Devid na ndikom-ya biaruru Ziklag n'ubọchi nke-atọ, na ndi Amalek amadewo na Negeb, made kwa na Ziklag, ha etib͕uwo kwa Ziklag, sure ya n'ọku,
2 dọta kwa ndinyom na ndi nile nọ na ya n'agha, site n'onye ntà we rue onye uku: ha emeghi ka onye ọ bula nwua, kama ha dupuru ha, je ije-ha.
3 Devid na ndikom-ya we ba n'obodo, ma, le, esurewo ya n'ọku; adọtawo kwa ndinyom-ha na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'agha.
4 Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá.
5 Adọta-kwa-ra ndinyom abua nke Devid n'agha, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwunye Nebal onye Kamel.
6 Devid we nọ na nkpà nke-uku; n'ihi na ndi-ya siri ka ha were nkume tub͕ue ya, n'ihi na nkpuru-obi ndi-ya nile di ilu, nwoke ọ bula n'ihi umu-ya ndikom na n'ihi umu-ya ndinyom: ma Devid mere onwe-ya ka ọ di ike nime Jehova, bú Chineke-ya.
7 Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ.
8 Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.
9 Devid we je, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi soro ya, ọ biarue miri-iyi Besoa, ma ndi anārapu n'azu guzoro n'ebe ahu.
10 Ma Devid nāchu, ya onwe-ya na nnù ndikom: ma ọgu ndikom iri guzoro n'azu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi igabiga miri-iyi Besoa:
11 ha we huta onye Ijipt n'ọhia, kuru ya jekuru Devid, nye ya achicha, o rie; ha we me ka ọ ṅua miri:
12 ha we nye ya iberibe mbadamba fig, na uyọkọ abua nke nkpuru-vine amiri ami; o we rie, mọ-ya we laghachikute ya: n'ihi na o righi nri, ọ ṅughi kwa miri, ubọchi atọ ehihie na abali.
13 Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m'bu, m'buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n'ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga.
14 Ayi onwe-ayi madere na Negeb nke ndi Keret, made kwa n'ala nke Juda nwere, made kwa na Negeb nke Keleb; ayi we sure Ziklag n'ọku.
15 Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.
16 O we me ka ọ rida, ma, le, ha ab͕asawo n'iru ala ahu nile, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nēme kwa ememe, n'ihi ihe-nkwata uku nile nke ha kwatara n'ala ndi Filistia, na n'ala Juda.
17 Devid we tib͕ue ha site n'ururuchi we rue anyasi echi-ya: ọ dighi kwa otù nwoke nime ha wepugara onwe-ya, ma-ọbughi nnù umu-okorọbia, ndi nọkwasiri na camel-ha, we b͕alaga.
18 Devid we naputa ihe nile Amalek chiri: Devid naputa-kwa-ra ndinyom-ya abua.
19 Ọ dighi kwa ihe fọduru ha iweghachi, ma ihe ntà ma ihe uku, ma umu-ndikom ma umu-ndinyom, ma ihe-nkwata ma ihe ọ bula ha were n'onwe-ha: Devid weghachiri ihe nile.
20 Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n'iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid.
21 Devid we biakute ọgu ndikom iri ahu, ndi ike gwuru nke-uku na ha apughi ijeso Devid n'azu, ndi ha me-kwa-ra ka ha nọdu n'akuku miri-iyi Besoa: ha we puta izute Devid, na izute ndi ya na ha nọ: Devid we biarue nso ndi ahu, jua ha ajuju bayere udo-ha.
22 Ndikom ọjọ nile na ndi jọb͕uru onwe-ha, n'etiti ndi soro Devid je, we za, si, N'ihi na ha esoghi ayi je, ayi agaghi-enye kwa ha ihe ọ bula nime ihe-nkwata nke ayi naputara, ma-ọbughi inye nwoke ọ bula nwunye-ya na umu-ya, ka ha we duru ha, la.
23 Devid we si, Umu-nnem, ihe Jehova nyere ayi, bú Onye debere ayi, nye kwa n'aka-ayi usu ahu ndi nāpunara madu ihe, ndi biara imegide ayi, unu agaghi-ewere ihe ahu me otú a.
24 Ònye gēge kwa unu nti n'okwu a? n'ihi na dika òkè nke onye nārida n'agha si di, otú a ka òkè nke onye nānọdu n'akuku ihe-ayi di: ha gēkekọ n'otù.
25 O rue, site n'ubọchi ahu we ga n'iru, na o doro ya ibu ukpuru na ibu ikpé nye Israel, rue ta.
26 Devid we biarue Ziklag, zigara ndi-okenye Juda, bú ndi-eyì-ya, ufọdu nime ihe-nkwata, si, Le, ihe-ngọzi unu gēnwe sitere n'ihe-nkwata nke ndi-iro Jehova;
27 o zigara ndi nọ na Bet-el, ziga-kwa-ra ndi nọ na Remot nke Negeb, ziga-kwa-ra ndi nọ na Jatia;
28 ziga-kwa-ra ndi nọ n'Aroea, ziga-kwa-ra ndi nọ na Sifmot, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Eshtemoa;
29 ziga-kwa-ra ndi nọ na Rakal, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi Jerahmeel, ziga-kwa-ra ndi nọ n'obodo nile nke ndi-Kinait;
30 ziga-kwa-ra ndi nọ na Họma, ziga-kwa-ra ndi nọ na Koa-ashan, ziga-kwa-ra ndi nọ n'Atak;
31 ziga-kwa-ra ndi nọ na Hebron, ziga kwa n'ebe nile ebe Devid onwe-ya na ndikom-ya nējeghari.