I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 28

O rue, na mb͕e ahu, na ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha ibu agha, ibuso Israel agha. Ekish we si Devid, Mara nke-ọma na mu ka i gēso pua ba n'ọmuma-ulo-ikwū, gi onwe-gi na ndikom-i.
2 Devid we si Ekish, N'ihi ya gi onwe-gi gāmara ihe orù-gi gēme. Ekish we si Devid, N'ihi ya onye nēdebe isim ka m'gēdo gi ubọchi nile.
3 Ma Samuel anwuruwo, Israel nile we tiere ya aka n'obi, lì kwa ya na Rema, bú n'obodo-ya. Sọl ewezugawo kwa n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa.
4 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha, bia, ma ulo-ikwū-ha na Shunem: Sọl we chikọta Israel nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Gilboa.
5 Sọl we hu ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, o we tua egwu, obi-ya we ma jijiji nke-uku.
6 Sọl we jua Jehova ase, ma Jehova azaghi ya, Ọ zaghi na nrọ, ma-ọbu n'Ìhè, ma-ọbu n'ọnu ndi-amuma.
7 Sọl we si ndi-orù-ya, Chọrọnum nwayi nwere mọ ọ nāju ihe, ka m'we jekuru ya, jua ya ase. Ndi-orù-ya we si ya, Le, otù nwayi di n'En-doa nke nwere mọ ọ nāju ihe.
8 Sọl we nwogharia onwe-ya, yiri uwe ọzọ, je, ya onwe-ya na ndikom abua tiyere ya, ha we biakute nwayi ahu n'abali: ọ si, Biko, were mọ i nāju ihe juaram ase, me ka ọ rigokutem, bú onye ọ bula m'gāsi gi.
9 Nwayi ahu we si ya, Le, gi onwe-gi amawo ihe Sọl mere, na o bipuwo n'ala ndi nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāb͕ara ndum ọnyà ime ka m'nwua?
10 Sọl we were Jehova ṅuara ya iyi, si, Jehova nādi ndu, Ahuhu ajọ omume agaghi-ezute gi ma-ọli n'ihe a.
11 Nwayi ahu we si, Ònye ka m'gēme ka ọ rigokute gi? Ọ si, Me ka Samuel rigokutem.
12 Nwayi ahu we hu Samuel, tie nkpu n'oké olu: nwayi ahu we gwa Sọl okwu, si, N'ìhi gini ka i ghọb͕uworom? n'ihi na gi onwe-gi bu Sọl.
13 Eze we si ya, Atula egwu: n'ihi na ọ̀ bu gini ka i huworo? Nwayi ahu we si Sọl, Ahuwom chi ka ha nēsi n'ala rigota.
14 Ọ si ya, Gini bu udi-aru-ya? Nwayi ahu we si, Agadi nwoke nārigota; eji kwa uwe-nwuda kpuchi nwoke ahu. Sọl we mata na Samuel ka ọ bu, ọ we rube isi-ya, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala.
15 Samuel we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēkweghi ka m'nọdu ndu, ime ka m'rigota? Sọl we si, Anọm na nkpà nke-uku; ndi Filistia nēbusokwam agha, ma Chineke ewezugawo Onwe-ya n'arum, Ọ dighi-azakwam ọzọ, ma ọ bu n'aka ndi-amuma ma-ọbu na nrọ: m'we kpọ gi, ka i we me ka m'mara ihe m'gēme.
16 Samuel we si, N'ìhi gini kwa ka i nājum ajuju, ebe Jehova wezugaworo Onwe-ya n'aru gi, we ghọ onye-iro-gi?
17 Ma Jehova emeworo Onwe-ya, dika O kwuru site n'akam: Jehova adọwapuwo kwa ala-eze n'aka-gi, nye ya madu-ibe-gi, bú Devid.
18 N'ihi na i geghi nti olu Jehova, i meghi kwa ka idi-ọku nke iwe-Ya dakwasi Amalek, n'ihi ya ka Jehova meworo gi ihe a ta.
19 Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia.
20 Sọl we da n'ala ngwa ngwa ka idi-elu-ya ra, o we tua egwu nke-uku, n'ihi okwu nile nke Samuel: ike adighi kwa nime ya; n'ihi na o righi nri n'ehihie ahu nile, na n'abali ahu nile.
21 Nwayi ahu we biakute Sọl, hu na aru mara ya jijiji nke-uku, ọ si ya, Le, nwanyi nējere gi ozi egewo nti olu-gi, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, nu kwa okwu-gi nile nke i gwaram.
22 Ma ub͕u a, biko, gi onwe-gi ge kwa nti olu nwayi nējere gi ozi, ka m'dọba kwa iberibe achicha n'iru gi; gi ri kwa, ka ike we di nime gi, mb͕e i nēje n'uzọ-gi.
23 Ma ọ juru aju, si, M'gaghi-eri ihe. Ndi-orù-ya, na nwayi ahu kwa, we rugide ya; o we ge nti olu-ha. O we si n'ala bilie, nọkwasi n'ihe-ndina.
24 Ma nwayi ahu nwere n'ulo-ya nwa-ehi emere ka ọ ma abuba; o we me ngwa, b͕ue ya, were kwa utu ọka, gwọ ya, were ya sie achicha ekoghi-eko:
25 o we bute ya nso n'iru Sọl, na n'iru ndi-orù-ya; ha we rie. Ha we bilie, la n'abali ahu.