I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 29

Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.
2 Ndi-isi ndi Filistia we nāgabiga ọgu ise, ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: Devid na ndikom-ya nāgabiga kwa n'azu, ha na Ekish.
3 Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n'aru ya ihe ọ bula di njọ site n'ubọchi ọ dapuru n'aka Sọl rue ta?
4 Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?
5 Nkà abughi Devid, onye ha zaritara onwe-ha ihe bayere ya n'ite-egwú si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?
6 Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n'ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n'ọmuma-ulo-ikwū n'akam di kwa nma n'anyam: n'ihi na ahutaghm ihe ọjọ n'aru gi site n'ubọchi i biakuterem rue ta: ma n'anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu.
7 Ma ub͕u a, laghachi, je kwa n'udo, ka i we ghara ime ihe ọjọ n'anya ndi-isi ndi Filistia.
8 Devid we si Ekish, Ma gini ka m'meworo? gini kwa ka i hutaworo n'aru orù-gi site n'ubọchi m'nọworo n'iru gi rue ta, na m'gaghi-abà buso ndi-iro onye-nwem, bú eze, agha?
9 Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n'anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n'agha.
10 Ma ub͕u a bilie n'isi-ututu, gi na ndi-orù onye-nwe-gi ndi soro gi bia: mb͕e unu biliri n'isi-ututu, mb͕e ìhè diri unu, laghachi-kwa-nu.
11 Devid we bilie n'isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n'ututu, ilaghachi n'ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.