I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 22

Devid we si n'ebe ahu je, wepuga onwe-ya rue ọb͕à Adulam: umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we nu ya, ha we ridakuru ya n'ebe ahu.
2 Ha we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, bú nwoke ọ bula nke nọ na nkpab͕u, na nwoke ọ bula nke nwere onye ọ nara ego n'ọmuru-nwa, na nwoke ọ bula nkpuru-obi-ya di ilu; o we buru onye-isi-ha: ihe ra ka nnù ndikom we nọ n'aka-ya.
3 Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem.
4 O we duru ha bia n'iru eze Moab: ha we biri n'aka-ya ubọchi nile Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike.
5 Gad, bú onye-amuma, we si Devid, Anọdula n'ebe a ewusiri ike; je, bara onwe-gi n'ala Juda. Devid we je, ba n'oké ọhia Heret.
6 Sọl we nu na amatara ihe bayere Devid na ndikom ya na ha nọ: ma Sọl nānọdu na Gibea, n'okpuru osisi tamarisk na Rema, ube-ya di kwa n'aka-ya, ndi-orù-ya nile nēguzo n'akuku ya.
7 Sọl we si ndi-orù-ya ndi nēguzo n'akuku ya, Biko, nurunu, unu ndi Benjamin; ọ̀ bu kwa unu nile ka nwa Jesi gēnye ubi na ubi-vine, ọ̀ bu unu nile ka ọ gēdo ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise?
8 na unu nile ekekọtawo onwe-unu imegidem, ọ dighi kwa onye nēkpughepu ntim ka m'nu ya mb͕e nwam na nwa Jesi b͕ara ndu, ọ dighi kwa onye nime unu ọ nēb͕u nb͕u n'obi n'ihim, ma-ọbu nke nēkpughepu ntim ka m'nu na nwam emewo ka orùm bilie imegidem, iche anwu, dika ta.
9 Doeg onye Edom we za, (n'ihi na ya onwe-ya nēguzo n'akuku ndi-orù Sọl), si, Ahurum nwa Jesi ka ọ nābiaru Nob, biakute Ahimelek nwa Ahaitub.
10 O we juara ya ase n'aka Jehova, nye ya ihe ọ gēri n'uzọ, nye kwa ya mma-agha Gọlaiat onye Filistia.
11 Eze we ziga ikpọ Ahimelek nwa Ahaitub, bú onye-nchu-aja, na ulo nna-ya nile, bú ndi-nchu-àjà ndi nọ na Nob: ha we biakute eze, ha nile.
12 Sọl we si, Biko, nuru, gi nwa Ahaitub. O we si, Lem, onye-nwem.
13 Sọl we si ya, N'ìhi gini ka unu kekọtaworo onwe-unu imegidem, gi onwe-gi na nwa Jesi, n'inye ya achicha na mma-agha, na n'ijuru ya ase n'aka Chineke, ka o we bilie imegidem, iche anwu, dika ta?
14 Ahimelek we za eze, si, Ònye kwa n'etiti orù-gi nile di ka Devid? ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa di nwa eze, o wezugawo kwa onwe-ya ibà n'etiti ndi nānu okwu-gi, ọ di kwa nsọpuru n'ulo-gi.
15 Ọ̀ bu ta ka m'malitere ijuru ya ase n'aka Chineke? ya burum ihe-árú: ka eze ghara ibo orù-ya ebubo ọ bula, ghara kwa ibo ulo nnam nile: n'ihi na orù-gi amaghi ihe ọ bula n'ihe a nile, nke di ntà ma-ọbu nke di uku.
16 Eze we si, I ghaghi inwu, Ahimelek, gi onwe-gi na ulo nna-gi nile.
17 Eze we si ndi-ọb͕a-ọsọ ndi nēguzo n'akuku ya, Chigharianu, me ka ndi-nchu-àjà Jehova nwua; n'ihi na aka-ha di kwa n'akuku Devid, na n'ihi na ha mara na onye nāb͕apu ka ọ bu, ma ha ekpughepughi ntim ka m'nu ya. Ma ndi-orù eze ekweghi isetipu aka-ha idakwasi ndi-nchu-àjà Jehova.
18 Eze we si Doeg, Gi onwe-gi chigharia, dakwasi ndi-nchu-àjà. Doeg onye Edom we chigharia, ya onwe-ya we dakwasi ndi-nchu-àjà, me ka ọgu ndikom anọ na ise nwua n'ubọchi ahu, bú ndi nēyi ephod nke ákwà ọcha.
19 O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.
20 Ma otù nwa-nwoke nke Ahimelek nwa Ahaitub nwere, aha-ya bu Abaiata, wepugara onwe-ya, b͕apu soro Devid.
21 Abaiata we gosi Devid na Sọl eb͕uwo ndi-nchu-àjà Jehova.
22 Devid we si Abaiata, Amaram n'ubọchi ahu, mb͕e Doeg, bú onye Edom, nọ n'ebe ahu, na ọ ghaghi igosi Sọl: mu onwem akpatawo ọnwu nke madu nile nke ulo nna-gi.
23 Ka mu na gi nọdu, atula egwu; n'ihi na onye ahu nke nāchọ ndum nāchọ ndu-gi: n'ihi na ihe-ndebe ka i bu n'akam.