I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 3

Nwata ahu, bú Samuel, we nējere Jehova ozi n'iru Ilai. Okwu Jehova we di oké ọnu na mb͕e ahu; ọ dighi ọhù ekwusara.
2 O rue, n'ubọchi ahu, mb͕e Ilai nēdina ala n'ebe-ya, (ma anya-ya malitere ihu inyoghi-inyoghi, na ọ pughi ihu uzọ,)
3 mb͕e oriọna Chineke akānyughi anyu, mb͕e Samuel nēdina ala n'ulo ukwu Jehova, ebe ib͕e Chineke di;
4 na Jehova kpọrọ Samuel òkù: o we si, Lem.
5 O we b͕akuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù; jeghachi dina ala. O we je dina ala.
6 Jehova we kpọ kwa òkù ọzọ, si, Samuel. Samuel we bilie jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ọ si, Akpọghm òkù, nwam; jeghachi dina ala.
7 Ma Samuel akāmaghi Jehova, akēkpugheghi kwa okwu Jehova nye ya.
8 Jehova we kpọ Samuel òkù ọzọ nke ub͕ò atọ. O we bilie, jekuru Ilai, si, Lem; n'ihi na i kpọrọm òkù. Ilai we ghọta na Jehova nākpọ nwa-okoro ahu òkù.
9 Ilai we si Samuel, Je, dina ala: ọ gēru kwa, ọ buru na Ọ kpọ gi òkù, na i gāsi, Kwue, Jehova; n'ihi na orù-Gi nānu. Samuel we je, dina ala n'ebe-ya.
10 Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu.
11 Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.
12 N'ubọchi ahu M'gēme ka okwu nile M'kwuworo banyere ulo-ya guzosie ike megide Ilai, site na nmalite we rue ọgwugwu.
13 Egosiwokwam ya na Mu onwem nēkpe ulo-ya ikpe rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi ajọ omume nke ọ mara, n'ihi na umu-ya ndikom nēwetara onwe-ha nkọcha, ma o b͕ochighi ha.
14 N'ihi ya M'we ṅuara ulo Ilai iyi, na agaghi-ewere àjà ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma kpuchie ajọ omume ulo Ilai rue mb͕e ebighi-ebi.
15 Samuel we dina ala rue ututu, we meghepu ọnu-uzọ ulo Jehova. Ma Samuel turu egwu igosi Ilai ọhù ahu.
16 Ilai we kpọ Samuel, si, Samuel, nwam. O we si, Lem.
17 Ọ si, Gini bu okwu ahu nke Ọ gwara gi? biko, ezonarilam ya: Chineke me gi otú a, me kwa gi ihe ọzọ otú a, ọ buru na i zonarim okwu ọ bula sitere n'okwu nile nke Ọ gwara gi.
18 Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.
19 Samuel we tó, Jehova nọye-kwa-ra ya, Ọ kweghi kwa ka okwu da n'ala sitere n'okwu-ya nile.
20 Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma.
21 Jehova we me ka ahú kwa ya anya ọzọ nime Shailo: n'ihi na Jehova kpughere Onwe-ya nye Samuel nime Shailo n'okwu Jehova.