I. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31


Isi 7

Ndikom Kiriat-jearim we bia, bugo ib͕e Jehova, bubata ya n'ulo Abinadab n'ugwu ntà ya, do Eleeza nwa-ya nwoke nsọ idebe ib͕e Jehova.
2 O rue, site n'ubọchi ib͕e ahu nọduru na Kiriat-jearim, na ubọchi bara uba; o we di orú arọ: ulo Israel nile we kwaso Jehova.
3 Samuel we gwa ulo Israel nile okwu, si, Ọ buru na obi-unu nile ka unu onwe-unu nēwere laghachikute Jehova, wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ na Ashtarot n'etiti unu, dozie obi-unu ibiakute Jehova, fè-kwa-nu nání Ya òfùfè: Ọ gānaputa kwa unu n'aka ndi Filistia.
4 Umu Israel we wezuga Bealim na Ashtarot, fè nání Jehova òfùfè.
5 Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m'gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu.
6 Ha we chikọta onwe-ha rue Mizpa, sere miri, wusi ya n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu, kwue n'ebe ahu, si, Ayi emehiewo megide Jehova. Samuel we kpe umu Israel ikpe na Mizpa.
7 Ndi Filistia we nu na umu Israel chikọtara onwe-ha na Mizpa, ndi-isi ndi Filistia we rigo imegide Israel. Umu Israel we nu ya, tua egwu ndi Filistia.
8 Umu Israel we si Samuel, Ab͕ala nkiti bayere ayi n'itiku Jehova, bú Chineke-ayi, nkpu, ka O we zọputa ayi n'aka ndi Filistia.
9 Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.
10 O rue, mb͕e Samuel nēsure àjà-nsure-ọku ahu, na ndi Filistia biaruru nso ibuso Israel agha: Jehova we were oké olu makwasi ndi Filistia éb͕è-elu-igwe n'ubọchi ahu, we me ka ha b͕a aghara; ewe tib͕ue ha n'iru Israel.
11 Ndikom Israel we si na Mizpa puta, chua ndi Filistia, tib͕ue ha rue okpuru Bet-ka.
12 Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.
13 Ewe me ka ndi Filistia ruru ala, ha abàghi ọzọ n'ókè-ala Israel: aka Jehova we digide ndi Filistia ubọchi nile nke Samuel.
14 Ewe nyeghachi Israel obodo nile nke ndi Filistia nara Israel, site n'Ekron we rue Gat; ókè-ala-ha ka Israel naputara n'aka ndi Filistia. Ma udo di n'etiti Israel na ndi-Amorait.
15 Samuel we kpe Israel ikpe ubọchi nile nke ndu-ya.
16 O we nēje buruburu kwa-arọ rue Bet-el, na Gilgal, na Mizpa; o we kpe Israel ikpe n'ebe ahu nile.
17 Nlata-ya bu na Rema, n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ya di; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ kpere Israel ikpe: o we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu.