II. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 1

O rue, mb͕e ọnwu Sọl gasiri, mb͕e Devid siri na ntib͕u Amalek lata, mb͕e Devid nọwo-kwa-ra na Ziklag ubọchi abua;
2 o rue, nubọchi nke-atọ, na, le, otù nwoke siri n'ọmuma-ulo-ikwū puta, site n'ebe Sọl nọ, uwe-ya nile dọwara adọwa, ájá dikwasi n'isi-ya: o rue, mb͕e ọ biakutere Devid, na ọ daruru ala, we kpọ isi ala.
3 Devid we si ya, Òle ebe i si bia? Ọ si ya, N'ọmuma-ulo-ikwū Israel ka m'wepugara onwem.
4 Devid we si ya, Gini bu ihe emere? biko, gosim. Ọ si, Na ndi Israel esiwo n'agha b͕alaga, ọzọ kwa, ọtutu nime ndi Israel adawo nwua; ọzọ kwa, Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu.
5 Devid we si nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya, Ì si aṅa mara na Sọl na Jonatan nwa-ya nwuru anwu?
6 Nwa-okorọbia ahu nke nēgosi ya we si, Ọ dabataram inọ n'ugwu Gilboa, ma, le, Sọl nādabere n'ube-ya; ma, le, ub͕o-ala na ndi-nwe inyinya sosiri ya ike.
7 o we gha anya n'azu, hum, we kpọm òkù. M'we si, Lem.
8 Ọ sim, Ònye ka i bu? M'we si ya, Onye Amalek ka m'bu.
9 Ọ sim, Biko, guzo n'akukum, me ka m'nwua, n'ihi na anya-ajù ejidewom: n'ihi na ndum nile dizu nimem.
10 M'we guzo n'akuku ya, me ka ọ nwua, n'ihi na amaram na ọ gaghi-adi ndu mb͕e ọ dasiri: m'were okpu-eze nke di n'isi-ya, na ọla-aka nke di n'ogwe-aka-ya, we chitara ha onye-nwem n'ebe a.
11 Devid we jide uwe-ya, dọwa ha; otú a ka ndikom nile ya na ha nọ me-kwa-ra.
12 Ha we tie aka n'obi, kwa ákwá, bue ọnu rue anyasi, n'ihi Sọl, na n'ihi Jonatan nwa-ya, na n'ihi ndi Jehova, na n'ihi ulo Israel; n'ihi na ha dara site na mma-agha.
13 Devid we si nwa-okorọbia nēgosi ya, Òle ebe i si bia? Ọ si Nwa ọbìa, bú onye Amalek, ka m'bu.
14 Devid we si ya, Ì si aṅa ghara itu egwu iseti aka-gi ibibi onye Jehova etere manu?
15 Devid we kpọ otù nime umu-okorọbia, si, Jerue nso, dakwasi ya. O we tib͕ue ya, o we nwua.
16 Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.
17 Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:
18 Ọ we si ha zi umu Juda abù uta: le, edewo ya n'akwukwọ Jasha.
19 Israel, eb͕uwo nmá-gi n'elu ebe di elu gi! Ndi-dike esiwo aṅa da!
20 Unu egosila ya nime Gat, Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon; Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu, Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.
21 Unu ugwu Gilboa, Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli: N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi, Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.
22 Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike, Uta Jonatan esighi na ha la azu, Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.
23 Sọl na Jonatan bu ndi nāhurita onwe-ha n'anya, buru kwa ndi di utọ na ndu-ha, Ekewaghi kwa ha n'ọnwu-ha; Ha di garagara kari ugo, Ha di ike kari ọdum.
24 Umu-ndinyom Israel, kwaranu Sọl ákwá, Onye nēyibe unu uwe uhie, ya na ihe-utọ di iche iche, Onye nātukwasi ihe-ichọ-nma ọla-edo n'uwe-unu.
25 Ndi-dike esiwo aṅa da n'etiti agha ahu! Jonatan, n'elu ebe-gi di elu ka i buru onye eb͕uru eb͕u.
26 Anọm na nkpà n'ihi gi, nwa-nnem Jonatan: I di utọ nke-uku n'ebe m'nọ: Ihu-n'anya-gi nke i hurum di ebube, Kari ihu-n'anya ndinyom.
27 Ndi-dike esiwo aṅa da! Ihe-agha esiwo aṅa la n'iyì!