Ii. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 9

Devid we si, Ọ̀ di onye ọ bula fọduru ọzọ nye ulo Sọl, ka m'we mere ya ebere n'ihi Jonatan?
2 Ulo Sọl nwere otù orù, aha-ya bu Ziba, ha we kpọ ya biakute Devid; eze we si ya, Gì onwe-gi bu Ziba? Ọ si, Orù-gi bu ya.
3 Eze we si, Ọ̀ dighi nwoke fọduru ulo Sọl ọzọ, ka m'we mere ya ebere Chineke? Ziba we si eze, Otù nwa-nwoke fọduru Jonatan, nke dara ngwurọ n'ukwu-ya abua.
4 Eze we si ya, Òle ebe ọ nọ? Ziba we si eze, Le, Onye ahu nọ n'ulo Makia nwa Amiel, nime Lodeba.
5 Eze, bú Devid, we ziga kuputa ya n'ulo Makia nwa Amiel, site na Lo-deba.
6 Mefiboshet, nwa Jonatan, nwa Sọl, we biakute Devid, da kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala. Devid we si, Mefiboshet, Ọ si, Le orù-gi!
7 Devid we si ya, Atula egwu; n'ihi na aghaghm imere gi ebere n'ihi Jonatan, bú nna-gi, m'gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile.
8 Ọ kpọ isi ala, si, Gini ka orù-gi bu, na i gēche iru n'ebe nkita nwuru anwu dikam nọ?
9 Eze we kpọ Ziba, onye buri nwa-okorọbia Sọl, si ya, Ihe nile Sọl na ulo-ya nile nwere ka m'nyeworo nwa onye-nwe-gi.
10 I gālu-kwa-ra ya ọlu ala-ubi, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na ndi-orù-gi; i gēwebata kwa nkpuru ọ miri, ka nwa onye-nwe-gi we nwe nri ọ gēri: ma Mefiboshet nwa onye-nwe-gi gēri nri na table nkem mb͕e nile. Ma Ziba nwere umu-ndikom iri na ise na orú ndi-orù.
11 Ziba we si eze, Dika ihe nile si di, nke onye-nwem, bú eze, nyere orù-ya n'iwu, otú a ka orù-gi gēme. Eze we si, Ma Mefiboshet ganēri ihe na table nkem, dika otù nime umu eze.
12 Mefiboshet nwe-kwa-ra otù nwatakiri-nwoke, aha-ya bu Maika. Ma ndi nile ndi bi n'ulo Ziba buru Mefiboshet ndi-orù.
13 Mefiboshet we biri na Jerusalem' n'ihi na ọ bu na table eze ka ọ nēri ihe mb͕e nile; ma ya onwe-ya dara ngwurọ n'ukwu-ya abua.