Ii. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 18

Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha.
2 Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.
3 Ndi-ya we si, I gaghāpu: n'ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n'ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n'obodo.
4 Eze we si ha, Ihe di nma n'anya-unu ka m'gēme. Eze we guzo n'akuku ọnu-uzọ-ama, ndi-ya nile we nāpu n'ọgu ise ọgu ise, na nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri.
5 Eze we nye Joab na Abishai na Itai iwu, si, Menu nwayọ n'aru nwa-okorọbia, bú Absalom, n'ihim. Ndi-ya nile nu-kwa-ra mb͕e eze nyere ndi-isi nile iwu bayere Absalom.
6 Ndi-ya we pua je n'ọhia izute Israel: agha ahu we di n'oké ohia Efraim.
7 Ewe tib͕ue ndi Israel n'ebe ahu n'iru ndi-orù Devid, ntib͕u uku we di n'ebe ahu n'ubọchi ahu, bú orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri.
8 Ewe nāb͕asa agha ahu n'ebe ahu n'elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n'etiti ndi Israel n'ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.
9 Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n'inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n'okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n'osisi terebinth ahu, ewe do ya n'etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n'okpuru ya gabigara.
10 Otù nwoke we hu ya, gosi Joab, si, Le, ahurum Absalom ka ọ kwuru n'osisi terebinth.
11 Joab we si nwoke ahu nke nēgosi ya, Ma, le, i huru ya, ma gini mere i tib͕ughi ya n'ebe ahu rue ala? ọ gābu kwa ọlum inye gi ọla-ọcha iri, na otù ihe-ọkiké.
12 Nwoke ahu we si Joab, Ọ buru kwa na mu onwem ejide n'ọbu-akam nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri, ma m'gaghi-eseti akam imegide nwa eze: n'ihi na ọ bu na nti-ayi ka eze nyere gi na Abishai na Itai iwu, si, Lezienu anya bayere nwa-okorọbia ahu, bú Absalom, onye ọ bula.
13 Ma asi na emem otú a, m'gēme ihe-ugha megide ndum, (ma ọ dighi okwu ọ bula agēzonari eze,) gi onwe-gi gēguzo kwa onwe-gi n'akuku ọzọ.
14 Joab we si, Ọ bughi otú a ka m'ganēche n'iru gi. O we chiri nkpa-n'aka atọ n'aka-ya, dubà ha n'obi Absalom, mb͕e ọ nānọ na ndu n'etiti osisi terebinth.
15 Umu-okorọbiua iri ndi nēbu ihe-agha Joab we b͕a gburugburu, tib͕ue Absalom, me ka o nwua.
16 Joab we fùa opì-ike, ndi Devid we si n'ichu Israel n'azu lata: n'ihi na Joab b͕ochiri ndi ahu.
17 Ha we were Absalom, tubà ya n'olùlù uku n'oké ọhia ahu, me ka oké obo uku nke nkume guzo n'elu ya: Israel nile we b͕alaga, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya
18 Ma Absalom, mb͕e ọ nọ na ndu, o were ogidi nke di na ndagwurugwu eze guzoro onwe-ya: n'ihi na ọ siri, Enweghm nwa-nwoke ime ka echeta aham: o we kpọ ogidi ahu n'aha-ya: ewe kpọ ya ihe-ncheta Absalom, rue ta.
19 Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.
20 Joab we si ya, Ọ bughi onye ozi ọma ka i gābu ta, kama i gēzi ozi ọma ubọchi ọzọ: ma ta i gaghi-ezí ozi ọma, n'ihi na nwa eze anwuwo.
21 Joab we si onye Kush, Je gosi eze ihe i huworo. Onye Kush ahu we kpọ isi ala nye Joab, b͕a ọsọ.
22 Ahimaaz nwa Zedok we si kwa Joab ọzọ, Ma otú ọ di, biko, ka m'b͕a ọsọ, mu onwem kwa, n'azu onye Kush. Joab we si, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi ganāb͕a ọsọ, nwam, ma ọ dighi ozi ọma ahutara gi.
23 Ma otú ọ di, m'gāb͕a ọsọ, ka o kwuru. Ọ si ya, B͕a ọsọ. Ahimaaz we b͕a ọsọ Buruburu-ala, b͕abiga onye Kush ahu.
24 Ma Devid nānọdu n'etiti ọnu-uzọ-ama abua ahu: onye-nche we jerue elu-ulo ọnu-uzọ-ama rue mbidi obodo, we welie anya-ya, hu, ma, le, otù nwoke nāb͕a ọsọ nání ya.
25 Onye-nche we kpọ òkù, gosi eze. Eze we si, Ọ buru na ọ bu nání ya, ozi ọma di n'ọnu-ya. O we bia si-ike, biarue nso.
26 Onye-nche we hu nwoke ọzọ ka ọ nāb͕a ọsọ: onye-nche we kpọ onye nēche ọnu-uzọ òkù, si, le, nwoke ọzọ nāb͕a ọsọ, nání ya. Eze we si, Onye ahu nēzi kwa ozi ọma.
27 Onye-nche we si, Mu onwem nāhu ọb͕ub͕a-ọsọ nke onye mbu, ọ di ka ọb͕ub͕a-ọsọ Ahimaaz nwa Zedok. Eze we si, Ezi nwoke ka onye ahu bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka ọ nābia izì.
28 Ahimaaz we kpọ òkù, si eze, Udo. Ọ kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke-gi, bu, Onye mechibidoworo ndikom ahu ndi weliri aka-ha imegide onye-nwem, bú eze.
29 Eze we si, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom: Ahimaaz we si, Ahurum oké ìgwè madu mb͕e Joab zitere orú eze na orù-gi, ma amaghm ihe ọ bu.
30 Eze we si, Chigharia, guzo onwe-gi n'ebe a. O we chigharia, guzo.
31 Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n'ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n'aka ndi nile nēbili imegide gi.
32 Eze we si onye Kush ahu, Ùdo diri nwa-okorọbia ahu, bú Absalom? Onye Kush we si, Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo megide gi imejọ gi, ka ha di ka nwa-okorọbia ahu.
33 Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n'ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!