Ii. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 17

Ahitofel we si Absalom, Biko, ka m'rọputa orú nnù ndikom na nnù iri, bilie, chua Devid n'azu n'abali a:
2 m'gābiakwasi kwa ya mb͕e ike gwuru ya onwe-ya, na mb͕e aka-ya nādighi ike, m'gēme kwa ka ọ ma jijiji: ndi nile ndi ya na ha nọ gāb͕alaga kwa; m'gētib͕u kwa eze, nání ya:
3 m'gēme kwa ka ndi-ya nile laghachikute gi: dika nlaghachi madu nile ka nwoke ahu bu, onye gi onwe-gi nāchọ: ndi Israel nile gānọ n'udi.
4 Okwu ahu ziri ezi n'anya Absalom na n'anya ndi-okenye nile nke Israel.
5 Absalom we si, Biko, kpọ kwa Hushai, bú onye-Akait, ka ayi nuru kwa ihe di kwa n'ọnu ya onwe-ya.
6 Hushai we biakute Absalom, Absalom we gwa ya okwu, si, Dika okwu a si di ka Ahitofel kwuru: àyi gēme ihe o kwuru? ọ buru na ayi agaghi-eme ya, gi onwe-gi kwue.
7 Hushai we si Absalom, Ọdu nke Ahitofel duworo ub͕u a adighi nma.
8 Hushai we si, Gi onwe-gi amawo nna-gi na ndikom-ya, na ndi-dike ka ha bu, ndi nkpuru-obi-ha di ilu ka ha bu kwa, dika bear ab͕abara aka nwa n'ọhia: nna-gi bu kwa nwoke agha, ọ gaghi-esoro kwa ndi-ya nọ ọnọdu abali.
9 Le, ub͕u ya onwe-ya ezowo onwe-ya n'otù olùlù ma-ọbu n'otù nime ọnọdu-ya: o gēru kwa, mb͕e ufọdu nime ha dara na nmalite, na onye ọ bula nānu ya gāsi, Ntib͕u di n'etiti ndi ahu nke nēso Absalom.
10 Onye ahu kwa, ọbuná onye bu dìnkpà, onye obi-ya di ka obi ọdum, ọ gāb͕aze ab͕aze: n'ihi na Israel nile amawo na dike ka nna-gi bu, ndi bu dìnkpà ka ha bu kwa, bú ndi ya na ha nọ.
11 Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n'ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n'agha ahu.
12 Ayi gābiakute kwa ya n'otù nime ọnọdu ebe agāchọta ya, ayi onwe-ayi gādakwasi kwa ya dika igirigi nādakwasi n'ala: ayi agaghi-eme kwa ka ọbuná otù onye fọdu n'etiti ya na n'etiti ndikom nile ndi ya na ha nọ.
13 Ma ọ buru na achikọta ya n'otù obodo, agēme kwa ka Israel nile chita udọ̀ n'obodo ahu, ayi gādọ kwa ya rue miri-iyi, rue mb͕e agaghi-ahuta ọbuná otù ajirija nkume n'ebe ahu.
14 Absalom na ndikom nile nke Israel we si, Idu-ọdu Hushai, bú onye-Akait, di nma kari idu-ọdu Ahitofel, Ma Jehova nyere iwu imebi ezi idu-ọdu nke Ahitofel, ka Jehova we me ka ihe ọjọ biakwasi Absalom.
15 Hushai we si Zedok na Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, Otú a na otú a ka Ahitofel duru Absalom na ndi-okenye Israel ọdu; otú a na otú a ka mu onwem du-kwa-ra.
16 Ma ub͕u a ziganu ngwa ngwa, gosi Devid, si, Anọla ọnọdu abali a n'ala ihe nādighi nke ọzara, kama i ghaghi igabiga; ka aghara iloda eze na ndi nile ndi ya na ha nọ.
17 Ma Jonatan na Ahimaaz nēguzo n'En-rogel; nwayi nēje ozi we je gosi ha; ndi ahu we je gosi eze, bú Devid: n'ihi na ọ gaghi-ekwe me, bú ka ahú ka ha ba n'obodo.
18 Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n'ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n'ogige-ya; ha we rida n'ebe ahu.
19 Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n'ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n'elu ya; ma ọ dighi ihe amara.
20 Ndi-orù Absalom we biakute nwayi ahu n'ulo, si, Òle ebe Ahimaaz na Jonatan nọ? Nwayi ahu we si ha, Ha agabigawo iyi miri. Ha we chọ, ma ha achọtaghi ha, ha we lata na Jerusalem.
21 O rue, mb͕e ha lasiri, na ha siri n'olùlù-miri ahu rigota, je, gosi eze, bú Devid; ha we si Devid, Bilienu, gabiga miri ngwa ngwa; n'ihi na otú a ka Ahitofel duworo ọdu megide unu.
22 Devid we bilie, ya na ndi nile ndi ya na ha nọ, ha we gabiga Jọdan; mb͕e ìhè ututu putara ọ dighi onye fọduru nke nāgabigaghi Jọdan.
23 Ma Ahitofel huru na emeghi ihe ọ duru n'ọdu, o we jikwa inyinya-ibu-ya, bilie, la n'ulo-ya, rue obodo-ya, o we nye ulo-ya iwu, kwub͕u onwe-ya: o we nwua, elíe ya n'ílì nna-ya.
24 Ma Devid biaruru Mahanaim. Absalom we gabiga Jọdan, ya onwe-ya na ndikom nile nke Israel tiyere ya.
25 Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.
26 Israel na Absalom we ma ulo-ikwū-ha n'ala Gilead.
27 O rue, mb͕e Devid biaruru Mahanaim, na Shobi nwa Nehash nke Raba umu Amon, na Makia nwa Amiel nke Lo-deba, na Bazilai onye Gilead nke Rogelim,
28 wetara nso Devid, weta kwa nso ndi ya na ha nọ, ihe-ndina, na ọkwa, na ite nke ọkpu-ite kpuru, na ọka wheat, na ọka barley, na utu ọka, na ọka aṅara aṅa, na akidi, na lentil, na ọka aṅara n'oko,
29 na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n'ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n'ọzara.