Ii. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 6

Devid we chikọta kwa ndikom nile arọputara arọputa n'Israel, orú nnù madu uzọ atọ na nnù iri-na-ise.
2 Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim.
3 Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà: Uza na Ahio, bú umu Abinadab, we nēdu ub͕ọ-ala ọhu ahu.
4 Ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà, ya na ib͕e Chineke: Ahio we nēje n'iru ib͕e ahu.
5 Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà.
6 Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Nakon, Uza we setia aka-ya rue ebe ib͕e Chineke di, jide ya, n'ihi na ehi nāb͕a ukwu.
7 Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.
8 Iwe Devid we di ọku n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.
9 Devid we tua egwu Jehova n'ubọchi ahu; ọ si, Ìb͕e Jehova gēsi aṅa biakutem?
10 Devid ekweghi kwa iwezugara onwe-ya ib͕e Jehova rue obodo Devid; ma Devid buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat.
11 Ib͕e Jehova we nọdu n'ulo Obed-edom, bú onye Gat, ọnwa atọ: Jehova we gọzie Obed-edom na ulo-ya nile.
12 Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n'ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n'obodo Devid.
13 O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n'àjà.
14 Devid were kwa ike-ya nile te egwún'iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n'ukwù.
15 Devid na ulo Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, nēbugota ib͕e Jehova.
16 O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya.
17 Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova.
18 Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha.
19 O we kesara ndi Israel nile, bú ìgwè nile nke Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otú ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya.
20 Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n'aru-ya ta n'anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n'aru-ya ekpupu!
21 Devid we si Maikal, Ọ bu n'iru Jehova, Onye rọputaramn kari nna-gi, kari kwa ulo-ya nile, inyem iwu ibu onye-ndú ndi Jehova, bú Israel: m'we gwú egwu n'iru Jehova.
22 Ma m'gēweta-kwa-ra onwem nkọcha kari nka, m'gādi kwa ala n'anyam: ma ndi orù-nwayi ndi i kwuru okwu bayere ha, n'etiti ha ka agāsọpurum.
23 Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.