Ii. Samuel

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24


Isi 24

Iwe Jehova we di kwa ọku ọzọ megide Israel, O we kpalie Devid imegide ha, si, Je guta Israel na Juda.
2 Eze we si Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, nke di n'aka-ya, Biko, jegharia n'ebo nile nke Israel, site na Dan we rue Bia-sheba, gukọtanu ndi Israel, ka m'we mara ọnu-ọgugu ndi Israel.
3 Joab we si eze, Ka Jehova, bú Chineke-gi, tukwasi-kwa-ra ndi Israel, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise, ka anya onye-nwem, bú eze, hu kwa ya: ma onye-nwem, bú eze, n'ìhi gini ka ihe a nātọ ya utọ?
4 Ma okwu eze di ike n'ebe Joab nọ, na n'aru ndi-isi usu-ndi-agha. Joab na ndi-isi usu-ndi-agha we si n'iru eze pua igukọta ndi ahu, bú Israel.
5 Ha we gabiga Jọdan, ma ulo-ikwū-ha n'Aroea, n'aka-nri obodo ahu nke di n'etiti ndagwurugwu Gad, we rue Jeza:
6 ha we biarue Gilead, ru kwa ala Tahtim-họdshi; ha we biarue Dan-jaan, je buruburu rue Zaidon,
7 biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba.
8 Ha we jegharia n'ala nile, biarue Jerusalem n'ọgwugwu ọnwa iteghete na orú ubọchi.
9 Joab we nye eze ọnu-ọgugu nke ngukọta ọ gukọtara ndi Israel: ma orú nnù ndikom ọgu uzọ ise di n'Israel, ndi bu dìnkpà ndi nāmiputa mma-agha; ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na uzọ abua na nnù iri.
10 Obi Devid we ta ya uta mb͕e ọ gusiri ndi Israel. Devid we si Jehova, Emehiewom nke-uku n'ihe m'meworo: ma ub͕u a, Jehova, biko me ka ajọ omume-orú-Gi gabiga; n'ihi na emewom ihe-nzuzu nke-uku.
11 Devid we bilie n'ututu, okwu Jehova we rue Gad nti, bú onye-amuma, onye-ọhu-uzọ nke Devid, si,
12 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.
13 Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.
14 Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko, ka ayi dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.
15 Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel site n'ututu we rue na mb͕e ákàrà: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we nwua n'etiti ndi Israel site na Dan we rue Bia-sheba.
16 Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.
17 Devid we gwa Jehova okwu, mb͕e ọ huru mọ-ozi ahu nke nētib͕u ndi Israel, ọ si, Le, mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam.
18 Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.
19 Devid we rigo dika okwu Gad si di, dika Jehova nyere n'iwu.
20 Arọna we le anya, hu eze na ndi-orù-ya ka ha nāgabigakute ya: Arọna we puta, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.
21 Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n'aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n'ebe ndi Israel nọ.
22 Arọna we si Devid, Ka onye-nwem, bú eze were ihe di nma n'anya-ya sure ọku, le, ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka nile na ihe ehi nile ka ha buru nkú:
23 ihe a nile onye-nwem eze ka Arọna, nyere eze. Arọna we si eze, Ka ihe-gi tọ Jehova, bú Chineke-gi, utọ
24 Eze we si Arọna, É-è; kama aghaghm izuru ya n'aka-gi n'ọnu-ahia: m'gaghi-esure-kwa-ra Jehova, bú Chinekem, àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. Devid we were ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri zuru ebe-nzọcha-ọka ahu na ehi ahu.
25 Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo. Ewe riọta Jehova aririo bayere ala ahu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu n'ebe Israel nọ.