Jeremaia

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40 41 42 43 44 45 46 47 48 49 50 51 52


Isi 45

Okwu ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, gwara Beruk nwa Neraia, mb͕e o dere okwu ndia n'akwukwọ site n'ọnu Jeremaia, n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si,
2 Okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere gi, Beruk, si:
3 I siri, Biko, ahuhu nādirim! n'ihi na Jehova atukwasiwo ihe-nwuta n'elu ihe-nb͕um; adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem, ma achọtaghm izu-ike.
4 Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M'wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M'kuworo n'ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.
5 Ma gi onwe-gi, ì nāchọrọ onwe-gi ihe uku? achọla ha: n'ihi na, le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi anu-aru nile, bú madu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma M'gēnye gi ndu-gi ka ọ buru ihe-nkwata n'ebe nile i gēje.